Gaa n'Isiokwu

Ọ̀ Bụ Ahụ́ Mmadụ Ka Jizọs Nwere Mgbe O Si n’Ọnwụ Bilie Ka Ọ̀ Bụ Ahụ́ Mmụọ?

Ọ̀ Bụ Ahụ́ Mmadụ Ka Jizọs Nwere Mgbe O Si n’Ọnwụ Bilie Ka Ọ̀ Bụ Ahụ́ Mmụọ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl kwuru na e mere ka Jizọs “nwụọ n’anụ ahụ́, ma e mere ka ọ dị ndụ [ya bụ, si n’ọnwụ bilie] na mmụọ.”​—1 Pita 3:​18; Ọrụ Ndịozi 13:34; 1 Ndị Kọrịnt 15:45; 2 Ndị Kọrịnt 5:​16.

 Ihe Jizọs kwuru gosiri na ọ gaghị enwe anụ ahụ́ ya na ọbara ya mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. O kwuru na ọ ga-enye ‘anụ ahụ́ ya n’ihi ndụ nke ụwa,’ iji gbapụta ụmụ mmadụ. (Jọn 6:​51; Matiu 20:28) A sị na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ya eburukwa ahụ́ ahụ o bu nwụọ, ọ pụtara na ọ kagbuola àjà ahụ ọ chụrụ. Ma, o meghị otú ahụ n’ihi na Baịbụl kwuru na o ji anụ ahụ́ ya na ọbara ya chụọ àjà “naanị otu ugboro.”—Ndị Hibru 9:​11, 12.

Ọ bụrụ na ọ bụ ahụ́ mmụọ ka Jizọs nwere mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, oleezi otú ndị na-eso ụzọ ya si hụ ya?

  •  Ndị mmụọ ozi nwere ike iyikwasị ahụ́ mmadụ. Dị ka ihe atụ, ndị mmụọ ozi yikwasịrị ahụ́ mmadụ n’oge ochie, sorokwa ụmụ mmadụ rie nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ. (Jenesis 18:​1-8; 19:​1-3) Ma, ha ka bụkwa ndị mmụọ ozi, nweekwa ike ịlaghachi eluigwe.​—Ndị Ikpe 13:15-​21.

  •  Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, o yikwasịrị ahụ́ mmadụ mgbe ụfọdụ otú ahụ ụfọdụ ndị mmụọ ozi mere n’oge ochie. Ma, ebe ọ bụ mmụọ, ọ na-anọkata pụta, nọkatakwa pụọ n’anya. (Luk 24:31; Jọn 20:19, 26) Ọ bụghị ahụ́ o yi pụta n’otu oge ka ọ na-eyi apụta n’oge ọzọ. N’ihi ya, naanị ihe ndị na-eso ụzọ ya ji amata ya bụ ihe o kwuru ma ọ bụ ihe o mere.​—Luk 24:30, 31, 35; Jọn 20:14-​16; 21:​6, 7.

  •  Mgbe Jizọs mere ka Tọmọs hụ ya, ahụ́ o yi pụta nwere àpà. Ihe mere o ji yiri ahụ́ ahụ bụ ka Tọmọs kweta na ọ bụ ya n’ihi na Tọmọs ekwetabughị na Jizọs esila n’ọnwụ bilie.​—Jọn 20:24-​29.