Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ilekọta Ndị Nne na Nna Merela Agadi?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ilekọta Ndị Nne na Nna Merela Agadi?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ọ bụ ụmụ ndị torola eto ka ọrụ ilekọta nne ma ọ bụ nna ha merela agadi dịịrị. Baịbụl kwuru ka ụmụ torola eto “buru ụzọ mụta itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ezinụlọ nke ha, mụtakwa ịdị na-akwụ ndị mụrụ ha  . .  ụgwọ ruuru ha, n’ihi na ọ bụ ihe dị mma n’anya Chineke.” (1 Timoti 5:4) Ọ bụrụ na ụmụ torola eto ana-elekọta nne na nna ha merela agadi, ọ pụtara na ha na-erube isi n’iwu Baịbụl ahụ bụ́ “Sọpụrụ nna gị na nne gị.”​—Ndị Efesọs 6:​2, 3.

 Baịbụl ekwughị kpọmkwem otú a ga-esi na-elekọta ndị nne na nna merela agadi. Ma ọ kọrọ akụkọ ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị fere Chineke, ndị lekọtara ndị mụrụ ha. O kwukwara ihe ndị bara uru nwere ike inyere ndị na-elekọta ndị merela agadi aka.

 Olee otú ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl si lekọta ndị nne na nna ha merela agadi?

 E nwere ụzọ dị iche iche ha si mee ya, n’ihi otú ihe si dịrị ha.

  •   Josef bi ebe dị ezigbo anya n’ebe nna ya merela agadi, bụ́ Jekọb, bi. Ma mgbe o kwere Josef omume, o mere ndokwa ka Jekọb bịa biri ebe dị ya nso. Josef lekọtara nna ya, nye ya nri, hụkwa na e nweghị ihe mere ya.​—Jenesis 45:​9-11; 47:​11, 12.

  •   Rut sooro nne di ya laa obodo ya. Ọ rụsikwara ọrụ ike iji lekọta ya.​—Rut 1:16; 2:​2, 17, 18, 23.

  •   Jizọs, obere oge tupu ya anwụọ, nwere onye ọ gwara ka o lekọtawa nne ya, bụ́ Meri. O yiri ka di ya anwụọla tupu mgbe ahụ.​—Jọn 19:​26, 27. a

 Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere ndị na-elekọta ndị nne na nna ha merela agadi aka?

 Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ nwere ike inyere ndị na-elekọta nne na nna merela agadi aka ka ha nwee ike die nsogbu ndị dị ka ike ọgwụgwụ na nchegbu a na-enwe mgbe ụfọdụ ma a na-elekọta ndị agadi.

  •   Sọpụrụ ndị mụrụ gị.

     Ihe Baịbụl kwụrụ: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.”​—Ọpụpụ 20:12.

     Olee otú a ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Otú ị ga-esi gosi na ị na-asọpụrụ ndị mụrụ gị bụ ịhapụ ha ka ha na-eme ihe ụfọdụ ndị ha ga-emeli n’onwe ha. O kwe mee, ha jiri aka ha kpebie otú a ga-esi na-elekọta ha. N’otu mgbe ahụkwa, meere ha ihe ndị i nwere ike imere ha iji nyere ha aka.

  •   Na-aghọta ha ma na agbaghara ha.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.”​—Ilu 19:11.

     Olee otú a ga esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna merela agadi ekwuo ihe ụfọdụ were gị iwe ma ọ bụ mee ihe gosiri na obi adịghị ya ụtọ n’ihe ị na-emere ya, jụọ onwe gị sị, ‘Olee otú ọ ga-adị m ma ọ bụrụ m nọ n’ụdị ọnọdụ a?’ Ọ bụrụ na ị ghọta otú ihe si dịrị ya ma na-agbaghara, ị ga-eme ka ihe ghara ịka njọ.

  •   Jụọ ndị ozọ.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.”​—Ilu 15:22.

     Olee otú a ga esi eme ihe a Baịbụl kwuru? E nwee ọrịa ndị mụrụ gị na-arịa, mee nchọnchọ ka ị mata ihe gbasara ọrịa ahụ ka i nwee ike ịma otú ị ga-esi nyere ha aka. Chọpụta ma e nwere ihe obodo na-emere ndị agadi, nke ga-eme ka ilekọta ha dịkwuo mfe. Jụọ ndị ọzọ lekọtarala nne ma ọ bụ nna merela agadi otú ha si mee ya. Ọ bụrụ na i nwere ụmụnne, unu lee ma ọ̀ ga-adị mma ka unu nwee nnọkọ ebe unu ga-anọ kparịta ihe ndị bụ́ mkpa ndị mụrụ unu, otú unu ga-esi elekọta ha na otú onye ọ bụla ga-esi nye aka.

    Lee ma ọ̀ ga-adị mma ka gị na ndị ezinụlọ unu nwee nnọkọ ka unu kparịta otú unu ga-esi elekọta ndị mụrụ unu

  •   Mara ebe ike gị ruru.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.”​—Ilu 11:2.

     Olee otú a ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Mara ebe ike gị ruru. Dị ka ihe atụ, e nweghị onye oge o nwere na-anaghị agwụ agwụ ma ọ bụ onye ike na-anaghị agwụ agwụ. Ebe ọ bụ na e nwere ebe ike gị ruru, ọ bụghị ihe niile ka ị ga-enwe ike imere ndị mụrụ gị. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka naanị gị agaghị ebuli ihe dị n’ilekọta ndị mụrụ gị, i nwere ike ịgwa ndị ọzọ n’ezinụlọ unu ka ha nyere gị aka ma ọ bụ gị achọọ ndị ọkachamara ka ha nyere gị aka.

  •   Lekọta onwe gị anya.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya.”­​—Ndị Efesọs 5:29.

     Olee otú a ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Ọ bụ eziokwu na ilekọta ndị mụrụ gị bụ ọrụ dịịrị gị, ọ dịkwa mkpa na ị ga na-elekọta onwe gị anya ma lekọta ndị ezinụlọ gị ma ọ bụrụ na ịlụọla di ma ọ bụ nwunye. I kwesịrị ịna-eri nri dị mma. I kwesịkwara ịna-ehi ụra ọfụma ma na-ezu ike nke ọma. (Ekliziastis 4:6) Ọ dịkwa mkpa ka i nwee oge onye ọzọ ga-enyetụrụ gị aka lekọta ndị agadi ahụ ma ọ bụrụ na o kwere omume. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, ahụ́ ga-aka eru gị ala ilekọta nne na nna gị mere agadi, ị ga-enwekwa ike ị ga-eji rụọ ọrụ a.

 Baịbụl ò kwuru ebe a ga-anọ lekọta ndị nne na nna merela agadi?

 Baịbụl agwaghị ụmụ toro eto ebe ha ga-anọ lekọta ndị nne na nna ha merela agadi. Ụfọdụ ndị na-ekpebi na ọ ka mma ka nne ha na nna ha merela agadi nọrọ n’ụlọ nke ha, ma ọ bụkwanụ ha akpọrọ ha. Mgbe ụfọdụ, e nwekwara ike ịkpọga ha n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Ndị ezinụlọ ahụ nwere ike ịnọkọ kpebie nke ga-akara onye ọ bụla mma.​—Ndị Galeshia 6:​4, 5.

a Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru gbasara ihe a Jizọs mere, sị: “O nwedịrị ike ịbụ na ọ dịla anya Josef [di Meri] nwụrụ, ya bụrụkwa na ọ bụ Jizọs na-elekọtazi Meri. Ugbu a Jizọs na-aga ịnwụ, ònye ga na-elọkatazi Meri? . . . Kraịst si otú a kụziere ndị bụ́ ụmụ na ha kwesịrị ịna-elekọta ndị nne na nna ha merela agadi.”​—The NIV Matthew Henry Commentary in One Volume, peeji nke 428-429.