Gaa n'Isiokwu

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile?

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile?

Ihe Baịbụl Kwuru

 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ndị mmadụ boro ya ebubo na ọ na-eme ka ya na Chineke ọ̀ hà. (Jọn 5:18; 10:30-33) Ma, o nweghị mgbe Jizọs kwuru na ya na Chineke hà. Kama, ọ sịrị na ‘nna ya ka ya ukwuu.’—Jọn 14:28.

 Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs enweghị mgbe ha chere na Jizọs na Chineke hà. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi kwuru na mgbe Chineke kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ na ‘o buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu.’ O doro anya na o nweghị mgbe Pọl chere na Jizọs na Chineke hà. Ọ bụrụ na o chere otú ahụ, ọ gaaraghị ekwu na ọ bụ Chineke buliri Jizọs n’ọkwá.—Ndị Filipaị 2:9.