Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ndị Filipaị 4:​6, 7​—“Unu Echegbula Onwe Unu Banyere Ihe Ọ bụla”

Ndị Filipaị 4:​6, 7​—“Unu Echegbula Onwe Unu Banyere Ihe Ọ bụla”

 “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ. Udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs chee obi unu na echiche unu nche.”​—Ndị Filipaị 4:​6, 7, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama n’ihe nile, sitenụ n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu n’ihu Chineke. Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”​—Ndị Filipaị 4:6, 7, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ihe Ndị Filipaị 4:6, 7 Pụtara

 Ọ bụrụ na nsogbu abịara ndị na-efe Chineke, ha nwere ike ikpegara ya ekpere ka o mee ka ha nwee ike idi nsogbu ahụ. O kwere nkwa na ya ga-enye ha udo ya, nke ga-eme ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha, meekwa ka obi ruo ha ala. Amaokwu nke 6 kwuru ụdị ekpere ndị ha ga-ekpe nke ga-eme ka ha nwee udo Chineke na-enye.

 Ịrịọsi arịrịọ ike bụ ekpere mmadụ ji obi ya niile na-arịọ Chineke arịrịọ. Dị ka Jizọs mere, mmadụ nwere ike ịrịọsi Chineke arịrịọ ike mgbe ọ gbajuru dọọrọ ya ná ndụ ma ọ bụ mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ. (Ndị Hibru 5:7) A na-ekpekarị ụdị ekpere a n’akwụsịghị akwụsị.

 Arịrịọ bụ ịkpọrọ Chineke ihe bụ́ mkpa anyị aha n’ekpere. Ndị na-efe ya nwere ike ịrịọ ya arịrịọ “n’ihe niile” na-akpa ha, ya bụ, “n’ọnọdụ ọ bụla” ha nọ na ya. Ma, ekpere ndị ahụ kwesịrị ịdaba n’ihe ndị Baịbụl kwuru bụ́ uche ya.​—1 Jọn 5:14.

 Ekpere e ji ekele Chineke bụ ikpe ekpere kelee ya maka ihe ndị o meere anyị nakwa ndị nke ọ ka ga-emere anyị. Ọ burụ na anyị ana-echeta ihe ọma ndị Chineke na-emere anyị, ọ ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ.​—1 Ndị Tesalonaịka 5:​16-18.

 Chineke na-aza ụdị ekpere ahụ. Otú ọ na-esi aza ya bụ na ọ na-eme ka anyị nwee udo. Okwu bụ́ “udo Chineke na-enye” na-eme ka anyị mata otú ahụ́ ga-esi ruo anyị ala maka na anyị na Chineke dị ná mma. (Ndị Rom 15:13; Ndị Filipaị 4:9) Udo a si n’aka Chineke “karịrị nghọta mmadụ” n’ihi na o nwere ike inyere anyị aka karịa otú anyị nwere ike ichetụdị n’echiche.

 Amaokwu Baịbụl a kwuru na udo Chineke na-enye ga-echeli obi anyị nche. Okwu Grik a sụgharịrị ‘iche nche’ bụ nwanne okwu e ji akọwa ihe ndị agha na-eme iji chebe obodo. Ọ bụ otú ahụ ka udo Chineke na-enye na-esi echebe mmadụ, mee ka uche na ahụ́ kpakọọ ya ọnụ. Ọ ga-emezi ka onye ahụ ghara ịna-echegbu onye ya maka nsogbu ndị o nwere.

 Udo a Chineke na-enye ‘na-esi n’aka Kraịst Jizọs’ echebe anyị, n’ihi na ọ bụ naanị n’aka Jizọs ka anyị na Chineke ga-esili adị ná mma. Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta anyị ná mmehie. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ebe ọ nọ, Chineke ga-agọzi anyị. (Ndị Hibru 11:6) Ọ bụ naanị n’aka Jizọs ka anyị nwere ike isi bịakwute Chineke. Jizọs kwuru, sị “E nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụrụ na o sighị na m.”​—Jọn 14:6; 16:23.

Ihe Ndị Gbara Ndị Filipaị 4:6, 7 Gburugburu

 Akwụkwọ Ndị Filipaị bụ akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst bi na Filipaị. a N’isi nke anọ, Pọl gbara ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ume ka ha na-aṅụrị ọṅụ, o kelekwara ha maka otú ha si na-emesapụ aka, nke mere yanwa obi ụtọ. (Ndị Filipaị 4:​4, 10, 18) Pọl kwuru otú ekpere ga-esi enyere anyị aka inweta udo a Chineke na-enye. O kwukwara ihe ndị anyị ga na-eme nakwa ihe ndị anyị ga na-eche n’echiche ga-eme ka “Chineke nke udo” nyere anyị aka.​—Ndị Filipaị 4:​8, 9.

a Obodo a dị n’ebe a na-akpọ Gris ugbu a.