Gaa n'Isiokwu

“Jehova Mere Ka Ha Ṅụrịa Ọṅụ”

Lee vidio a ka ị hụ otú Zerọbabel, nnukwu onye nchụàjà bụ́ Jọshụa, na ndị Izrel ndị ọzọ si Babịlọn lọta si gosi na ha nwere okwukwe na obi ike n’agbanyeghị na ndị iro ha na-emegide ha. Okwukwe na obi ike ha nwere mere ka ha nọgide na-enwe ọṅụ. Vidio a si n’akwụkwọ Ezra 1:​1-6; 3:​1-6, 10-13; 4:​1-7, 11-16; 5:​3-5; 6:​6-12, 22; Hagaị 1:​2-11; 2:​3-9; Zekaraya 1:​12-16; 2:​7-9; 3:​1, 2; 4:​6, 7.