Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

Ha Hụrụ Ụmụnna Ha n’Anya

Ha Hụrụ Ụmụnna Ha n’Anya

A Malitere Ụlọ Akwụkwọ Ọhụrụ Maka Mkpa E Nwere

Jehova gọziri ozi ọma ụmụnna anyị nọ na Dọminikan Ripọblik na-ekwusa. N’afọ 1994, ndị nkwusa e nwere na Dọminikan Ripọblik dị ihe dị ka puku iri na isii, narị atọ na iri ise na anọ. E nwekwara ọgbakọ dị narị abụọ na iri ise na itoolu. N’ihi ya, a chọkwuru ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru eru ga na-elekọta ọgbakọ ndị a. N’afọ 1994, Òtù Na-achị Isi kwuru ka a malite Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na Dọminikan Ripọblik. Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.

Ka ọ na-erule ọnwa Ọktoba afọ 2011, e nweela klas iri abụọ na ise n’ụlọ akwụkwọ a. A zụọkwala ihe dị ka narị ụmụ akwụkwọ isii na ya. Ka ọ dị ugbu a, ihe karịrị ọkara ndị gụcharala akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a nọ n’ụdị dị iche iche nke ozi oge niile. Mmadụ iri asaa na otu n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ebe mmadụ ise bụ ndị nlekọta sekit. Ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ ka a nọ nwee klas nke mbụ ruo nke iri. Ma, malite na klas nke iri na otu, a nọzi n’ebe a rụrụ maka ụlọ akwụkwọ a, ya bụ, na Vila Gọnzalez, na-enwe ya.

“Ndịàmà Jehova Na-enyere Ibe Ha Aka”

N’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Septemba, afọ 1998, oké ifufe kpara mkpamkpa na Dọminikan Ripọblik. Ọ gbawara ọtụtụ ndị aka ụlọ, gbuokwa ihe karịrị narị mmadụ atọ. Kọmitii Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka na Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè ji Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na La Romana mere ebe ha ga-anọ na-enyere ụmụnna anyị ọdachi dakwasịrị aka. Ihe dị ka narị ụmụnna atọ wepụtara onwe ha nyere ụmụnna anyị ndị a aka. Ụmụnna ndị si mba iri na isii ndị ọzọ so na ha.

Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a rụrụ ọhụrụ na ndị nke a rụzigharịrị arụzigharị dị iri abụọ na atọ. Ụlọ ụmụnna anyị ndị a rụzigharịrị na ndị a rụrụ ọhụrụ karịrị narị asatọ. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị merela agadi aha ya bụ Carmen. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile. Mgbe oké ifufe ahụ mebiri ụlọ o birila afọ iri atọ na asatọ, obi gbawara ya. Ma, obi bụ ya sọ aṅụrị mgbe ụmụnna iri na ise bịara na nke ya rụwara ya ụlọ ọhụrụ. Ọ sịrị: “Jehova na-eche banyere anyị mgbe niile. Ọ na-elekọta anyị. Legodị ọmarịcha ụlọ ụmụnna anyị na-arụrụ m. Ndị agbata obi m sịrị: ‘Ndịàmà Jehova na-enyere ibe ha aka. Ha hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu.’” Ọtụtụ ndị kwukwara ụdị ihe a n’ebe dị iche iche mgbe ha hụrụ otú ụmụnna anyị si na-enyere ụmụnna anyị ndị ọdachi dakwasịrị aka.

N’agbanyeghị na oké ifufe ahụ mebiri ọtụtụ ihe, aka anyị nyeere ụmụnna anyị na obi anyị kasiri ha mere ka ahụ́ ruo ha ala. Nke ka nke bụ na mbọ ụmụnna anyị gbara inyere ụmụnna ibe ha aka mere ka e too Jehova, onye na-akasi anyị obi.

A Rụwara Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ike n’Ike

Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ, a chọkwuru Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi ya, na Nọvemba afọ 2000, ụmụnna anyị na Dọminikan Ripọblik malitere ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. E si n’ego a na-eji arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ndị na-abaghị ọgaranya, na-enyere ha aka. N’ihi ya, ọgbakọ nwere ike ịrụ ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihe dị ka ọnwa abụọ. N’ihe dị ka Septemba afọ 2011, ụmụnna na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze arụọla ma ọ bụ rụzigharịa ihe dị ka otu narị Ụlọ Nzukọ Alaeze na iri anọ na ise.

Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na ụmụnna ndị rụrụ ha emeela ka Ndịàmà Jehova nwee aha ọma. Dị ka ihe atụ, n’otu obere obodo dị n’ebe ugwu Dọminikan Ripọblik, ụmụnna anyị hụrụ ala ga-adị mma ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche jụrụ onye nwe ya ma ọ̀ ga-eresị anyị ya. Nwoke nwe ya gwara ya, sị: “Agaghị m eresị ya unu, karịchaa ma ọ bụrụ na unu ga-eji ya arụ chọọchị.”

Obere oge ha kwuchara ihe a, onye nwe ala ahụ gara Puweto Plata ka ọ hụ deede ya ahụ́ na-adịghị. Deede ya ahụ bụ Onyeàmà Jehova. Mgbe o rutere, ọ chọpụtara na otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova akpọrọla ya na-elekọta. Ha na-akpọ ya aga ụlọ ọgwụ, ọmụmụ ihe, na ozi ọma. Nwoke ahụ jụrụ deede ya ahụ ego ole ọ kwụrụ maka ihe ndị a ha na-emere ya. Ọ gwara ya na o nweghị ihe ha nara ya n’ihi na ha bụ ụmụnna ya.

“Ndị a bụ ndị kacha dịrị n’otu na ndị kacha nwee obiọma m hụtụrụla”

Aka a ezinụlọ a na-enyere nwanna anyị ahụ metụrụ nwanne ya nwoke n’obi. N’ihi ya, ọ kpọrọ onye ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche ya na ya kwuru okwu ala gwa ya na ya chọziri iresị ha ala ahụ. Ụmụnna anyị zụrụ ala ahụ ma bido ịrụ ya Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nwunye nwoke nwe ala ahụ anabughị ele Ndịàmà Jehova anya ọma. Ma, mgbe ọ hụrụ otú ụmụnna anyị si na-arụkọ ọrụ ọnụ, ọ sịrị, “Ndị a bụ ndị kacha dịrị n’otu na ndị kacha nwee obiọma m hụtụrụla.”