Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

JỌJIA

M Chere na O Nweghị Ihe Kọrọ M

Madona Kankia

M Chere na O Nweghị Ihe Kọrọ M
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1962

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1990

  • ONYE Ọ BỤ Ọ nọbu n’Òtù Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ndị Kọmunist na Jọjia. O nyerela ọtụtụ mmadụ aka ha abata n’ọgbakọ. N’afọ 2015, o so ná ndị gụchara akwụkwọ na klas nke mbụ nke Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze e mere na Tibilisi.

MGBE e ziri m ozi ọma n’afọ 1989, eso m ná ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Òtù Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Kọmunist e nwere n’obodo anyị bụ́ Senakị. Na Jọjia, m sokwa ná Ndị Omeiwu n’Ọchịchị Sọviet nke Jọjia. E nwere ike iji ya tụnyere ndị omeiwu n’Ụlọ Nzukọ Omeiwu ndị e nwere ugbu a. E nwekwara nwoke mụ na ya na-akpa maka ọlụlụ mgbe ahụ. Ihe ndị a mere ka m chee na o nweghị ihe kọrọ m.

Mama m na papa m kụziiri m ịhụ Chineke n’anya. N’ihi ya, ekweere m na Chineke dị, n’agbanyeghị na abụ m onye Kọmunist. Ndị Kọmunist ekweghị na Chineke dị. Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, ha ji Baịbụl zaa m ajụjụ niile m nwere. Nke a mere ka m nyefee Jehova ndụ m. Ihe a were ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi m, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ, na nwoke ahụ chọrọ ịlụ m, ezigbo iwe.

Ugbu a m na-esozi Ndịàmà Jehova, ndị ezinụlọ anyị jụrụ m. N’ihi ya, ekpebiri m na m ga-ahapụ ụlọ, hapụkwa ọrụ m. Ahapụkwara m òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ m nọ na ya, kwụsịkwa ịbụ onye omeiwu. Mgbe e mechara m baptizim, ndị enyi m na ndị ezinụlọ anyị malitere inyekwu m nsogbu. Ebe ọ bụ na abụ m onye a ma ama n’obodo anyị, ebe niile malitere ịgba ghara ghara n’ihi na aghọọla m Onyeàmà Jehova. Ọ bụ ihe a mere ka m kwaga Kutaịsi, bụ́ ebe m nọ malite ịsụ ụzọ oge niile ozugbo.

Ọ na-abụ ndị mmadụ jụọ m ma obi ọ̀ dị m ụtọ n’ahụhụ niile m na-ata n’ihi ịbụ Onyeàmà Jehova, m na-agwa ha ozugbo na obi dị m ezigbo ụtọ. Ọ bụ eziokwu na ndị mụrụ m aghọtaghị ihe mere m ji bụrụ Onyeàmà Jehova, ma obi dị m ụtọ na ha kụziiri m ịhụ Chineke na ndị agbata obi m n’anya. Ihe a ha kụziiri m enyerela m ezigbo aka ná ndụ.