Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

1914—Afọ Dị Ịrịba Ama n’Amụma Bible

1914—Afọ Dị Ịrịba Ama n’Amụma Bible

ỌTỤTỤ iri afọ tupu afọ 1914, ndị mmụta Bible kpọsara na ihe ndị dị ịrịba ama ga-eme n’afọ ahụ. Gịnị bụ ihe omume ndị a, ihe ndị dịkwa aṅaa na-egosi na 1914 bụ afọ dị mkpa otú ahụ?

Dị ka e dekọrọ na Luk 21:24, Jizọs kwuru, sị: “Ndị mba ọzọ ga-azọ Jeruselem ụkwụ, ruo mgbe oge a kara aka nke ndị mba ọzọ [“oge ndị Jentaịl,” King James Version] ga-ezu.” Tupu mgbe ahụ, Jeruselem bụ isi obodo mba ndị Juu—ebe ndị eze sitere n’eriri Eze Devid si na-achị. (Abụ Ọma 48:1, 2) Otú ọ dị, ndị eze ndị a pụrụ iche n’ebe ndị ndú nke mba dị iche iche nọ. Ha nọkwasịrị “n’ocheeze Jehova” dị ka ndị nnọchianya Chineke n’onwe ya. (1 Ihe E Mere 29:23) Jeruselem si otú a bụrụ ihe nnọchianya nke ọchịchị Jehova.

Otú ọ dị, ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa ka ‘ndị mba ọzọ si malite ịzọ ọchịchị Chineke ụkwụ,’ oleekwa mgbe ha mere otú ahụ? Nke a mere n’afọ 607 T.O.A. mgbe ndị Babilọn meriri Jeruselem. O nweghịzi onye nọ ‘n’ocheeze Jehova,’ a kwụsịtụkwara inwe ndị eze sitere n’eriri Devid. (2 Ndị Eze 25:1-26) ‘Ịzọ ụkwụ’ a ọ̀ ga-adịru mgbe ebighị ebi? Ee e, n’ihi na amụma Ezikiel kwuru banyere eze ikpeazụ nke Jeruselem, bụ́ Zedekaịa, sị: “Wezụga ákwà nkuku isi ahụ, bupụ okpueze ahụ: . . . ọ gaghị adị ruo mgbe ọ ga-abịa, bụ́ onye o ruru aka; M ga-ewerekwa ya nye ya.” (Ezikiel 21:26, 27) Onye okpueze Devid “ruru aka” bụ Jizọs Kraịst. (Luk 1:32, 33) N’ihi ya, ‘ịzọ ụkwụ’ ahụ ga-akwụsị mgbe Jizọs ghọrọ Eze.

Olee mgbe ihe ahụ dị ịrịba ama ga-eme? Jizọs gosiri na ndị Jentaịl ga-achị ruo oge a kapịrị ọnụ. Ihe e dekọrọ na Daniel isi nke 4 nwere ihe ndị na-enye aka ịgụkọ ogologo oge nke ahụ ga-ewe. Ọ na-akọ banyere nrọ amụma nke Eze Nebukadneza nke Babilọn rọrọ. Ọ hụrụ nnukwute osisi e gbuturu egbutu. Úkwù ya enweghị ike ito n’ihi na e ji ígwè na ọla kee ya agbụ. Otu mmụọ ozi kwuru, sị: ‘Ka oge asaa gabigakwa ya n’isi.’—Daniel 4:10-16.

N’ime Bible, mgbe ụfọdụ a na-eji osisi edochi anya ọchịchị. (Ezikiel 17:22-24; 31:2-5) N’ihi ya, mgbutu e gbuturu osisi ihe atụ ahụ na-egosi otú a ga-esi kwụsịtụ ịchịisi Chineke, bụ́ nke ndị eze nọ na Jeruselem nọchiri anya ya. Otú ọ dị, ọhụụ ahụ gosiri na ‘ụkwụ a a ga-azọ Jeruselem’ agaghị adịte aka—“oge asaa.” Olee otú oge ahụ hà n’ogologo?

Mkpughe 12:6, 14 na-egosi na oge atọ na ọkara hà ka “otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii.” Ya mere, “oge asaa” ga-aka nke ahụ okpukpu abụọ, ma ọ bụ ọ ga-eru ụbọchị 2,520. Ma ndị Jentaịl akwụsịghị ‘ịzọ’ ịchịisi Chineke ụkwụ nanị n’ụbọchị 2,520 nkịtị ka Jeruselem dasịrị. N’ihi ya, o doro anya na amụma a na-ekwu banyere oge ka nnọọ nke ahụ ogologo. Dabere n’ihe e dere n’Ọnụ Ọgụgụ 14:34 nakwa n’Ezikiel 4:6, bụ́ ndị na-ekwu banyere “otu ụbọchị otu afọ,” “oge asaa” ahụ ga-eru afọ 2,520.

Afọ 2,520 malitere n’October 607 T.O.A., mgbe ndị Babilọn meriri Jeruselem, e wepụkwara eze sitere n’eriri Devid n’ocheeze ya. Oge ahụ kwụsịrị n’October 1914. N’oge ahụ, “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” bịara ná njedebe, e chikwara Jizọs Kraịst echichi dị ka Eze eluigwe nke Chineke. *Abụ Ọma 2:1-6; Daniel 7:13, 14.

Dị ka Jizọs buru n’amụma, “ọnụnọ” ya dị ka Eze eluigwe abụwo nke ihe ndị dị ịrịba ama na-eme n’ụwa kara akara—agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ọrịa na-efe efe. (Matiu 24:3-8; Luk 21:11) Ihe omume ndị dị otú ahụ na-agba nnọọ akaebe na afọ 1914 bụ oge a mụrụ Alaeze eluigwe nke Chineke n’ezie, ọ bụkwa oge ‘ụbọchị ikpeazụ’ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a malitere.—2 Timoti 3:1-5.

^ par. 9 Site n’October 607 T.O.A. ruo n’October 1 T.O.A. dị afọ 606. Site n’October 1 T.O.A. ruo n’October 1914 nke O.A. dị afọ 1,914. Ọ bụrụ na anyị agbakọta afọ 606 na afọ 1,914, anyị ga-enweta afọ 2,520. Iji nweta ihe ọmụma banyere ọdịda Jeruselem dara na 607 T.O.A., lee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! peeji nke 94-97, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.