Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ezigbo nwanna anyị:

Ị manụ na ọtụtụ n’ime ihe ndị dị na Baịbụl bụ akụkọ gbasara ndị mmadụ. Ọtụtụ n’ime ndị a a kọrọ akụkọ ha fere Chineke. Ha nwere ụdị nsogbu ndị anyị na-enwe, nweekwa “ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) Nsogbu ndị bịaara ụfọdụ n’ime ha mekwara ka ha daa mbà. O nwekwara ndị ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ha na ha na-efekọ Chineke mejọrọ, nweekwa ndị obi ha nọ na-ama ikpe maka ihe ọjọọ ha mere.

Ma, ihe ndị ahụ hà mere ka ha hapụ Jehova kpamkpam? Mba. Ọ dị ọtụtụ n’ime ha otú ọ dị Devid mgbe o kpegaara Chineke ekpere, sị: “Ana m awagharị dị ka atụrụ furu efu. Biko, chọọ ohu gị, n’ihi na echefughị m ihe i nyere n’iwu.” (Abụ Ọma 119:176) Otú a ọ dị Devid ọ̀ bụ otú ọ dị gị?

Jehova anaghị echefu ndị ohu ya si n’ìgwè atụrụ ya kpafuo. Kama nke ahụ, ọ na-enyere ha aka ka ha lọghachi. Ọ na-esikarị n’aka ndị ohu ya eme ya. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe ọtụtụ nsogbu bịaara ohu Chineke bụ́ Job. Akụnụba ya lara n’iyi, ụmụ ya anwụọ, ya arịawakwa ọrịa ọjọọ. Job dikwara okwu ọjọọ ndị kwesịrị ịkasi ya obi nọ na-agwa ya. Ma, o nweghị mgbe ọ hapụrụ Jehova, ọ bụ eziokwu na o nwere mgbe o chere na ọ bụ Jehova kpataara ya nsogbu ya. (Job 1:22; 2:10) Olee otú Jehova si nyere Job aka ịgbanwe echiche ya?

Otu ihe Jehova mere bụ na o si n’aka onye ya na Job na-efekọ Chineke aha ya bụ Ịlaịhu nyere Job aka. Mgbe Job kọọrọ Ịlaịhu otú o si dịrị ya, Ịlaịhu gere ya ntị ma mechaa gwa ya okwu. Gịnị ka ọ gwara ya? Ọ̀ katọrọ Job ma ọ bụ kwuo ihe ga-eme ka obi Job mawa ya ikpe ka ọ mata na ihe o mere adịghị mma? Ọ̀ bịara gosiwa Job na ya ka ya mma? O metụdịghị ụdị ihe ahụ. Mmụọ nsọ Chineke mere ka Ịlaịhu kwuo, sị: “Ihe ị bụ n’anya ezi Chineke ka mụ onwe m bụ; ọ bụkwa ụrọ ka e ji kpụọ m.” Ịlaịhu gwaziri Job ihe mesiri ya obi ike. Ọ sịrị ya: “Ọ dịghị ihe ụjọ dị n’ebe m nọ nke ga-emenye gị ụjọ, ọ dịghịkwa nsogbu m na-enye gị nke ga-adị arọ n’ahụ́ gị.” (Job 33:6, 7) Ịlaịhu emeghị ihe ọ bụla ga-eme ka nsogbu Job ka njọ. Kama, o medara obi nye Job ndụmọdụ ma gbaa ya ume.

Biko, mara na ọ bụkwa otu ihe ahụ ka anyị bu n’obi dee broshọ a. Anyị bu ụzọ gee ụfọdụ ndị hapụrụla ọgbakọ ntị, matakwa otú ihe si dịrị ha. (Ilu 18:13) Anyị bịaziri kpee ekpere ma leba anya n’Akwụkwọ Nsọ, gụọ gbasara otú Jehova si nyere ndị ohu ya aka mgbe nsogbu bịaara ha. N’ikpeazụ, anyị chịkọtara akụkọ ndị ahụ nakwa ihe ụfọdụ mere n’oge anyị a ma dee ha na broshọ a. Biko, gbalịa gụọ broshọ a. Anyị hụrụ gị n’anya.

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova