Pita Nke Mbụ 5:1-14

  • Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke (1-4)

  • Dịrịnụ umeala n’obi, na-echekwanụ nche (5-11)

    • Na-akọrọnụ Chineke ihe niile na-echegbu unu (7)

    • Ekwensu dị ka ọdụm na-agbọ ụja (8)

  • Ihe ndị ikpeazụ Pita kwuru (12-14)

5  Ebe mụnwa bụkwa okenye, na-agbakwa àmà gbasara ahụhụ Kraịst tara, sorokwa ná ndị a ga-eme ka a hụ na ha dị ebube,+ ana m agba ndị bụ́ okenye n’ime unu ume, sị:  Ebe unu bụ ndị nlekọta, na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke+ ndị e nyefere unu n’aka ka unu na-elekọta. Unu azụla ha ka à manyere unu amanye, kama jirinụ obi unu niile na-azụ ha otú ga-amasị Chineke.+ Unu azụkwala ha ka unu rigbuo ha,+ kama ka ịzụ ha na-anụ unu ọkụ n’obi.  Unu emekwala ka ọ̀ bụ unu nwe ndị Chineke,+ kama na-akpanụ àgwà ìgwè atụrụ Chineke ga na-eṅomi.+  Mgbe a ga-eme ka onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ+ pụta ìhè, unu ga-enweta ihe nrite* dị ebube nke na-enweghị ike imebi emebi.+  Ụmụ okorobịa, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ndị okenye.+ Ma unu niile, dịrịnụ umeala n’obi* n’otú unu si emeso ibe unu ihe, n’ihi na ihe ndị mpako anaghị amasị Chineke, ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.+  N’ihi ya, wedanụ onwe unu ala otú Chineke, onye dị ike, chọrọ,* ka o bulie unu elu mgbe oge ruru.+  Na-akọrọnụ ya* ihe niile na-echegbu unu,+ n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.+  Na-echenụ echiche nke ọma, na-echekwanụ nche.+ Ekwensu, bụ́ onye iro unu, na-ejegharị ka ọdụm na-agbọ ụja, na-achọ onye ọ ga-eri.+  Ma na-alụsonụ ya ọgụ,+ siekwanụ ike n’okwukwe, ebe unu ma na ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a unu na-ata.+ 10  Ma mgbe unu tatụchara ahụhụ, Chineke, onye na-eme amara n’ụzọ niile, onye kpọrọ unu ka unu na Kraịst dịrị n’otu nakwa ka unu dịrị ebube ruo mgbe ebighị ebi,+ ga-azụru unu n’isi. Ọ ga-eme ka unu kwụsie ike.+ Ọ ga-eme ka unu sie ike,+ meekwa ka unu kwụrụ chịm. 11  Ọ bụ ya nwe ike ruo mgbe ebighị ebi. Amen. 12  Ọ bụ Silvenọs,*+ nwanna e kwesịrị ịtụkwasị obi, nyeere m aka dee akwụkwọ ozi a dị nkenke. Edetaara m ya unu iji gbaa unu ume na iji mee ka unu mara ezigbote amara Chineke meere unu. Jirikwanụ amara a kpọrọ ihe. 13  Nwanna nwaanyị ahụ nke nọ na Babịlọn, onye a họọrọ otú a họọrọ unu, na-ekele unu. Mak+ nwa m na-ekelekwa unu. 14  Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu* iji gosi na unu hụrụ ha n’anya. Ka udo dịrị unu niile ndị ha na Kraịst dị n’otu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “okpueze.”
Ma ọ bụ “yirinụ umeala n’obi ka uwe.”
Na Grik, “wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke.”
Ma ọ bụ “Nyefeenụ ya.”
Aha ya ọzọ bụ Saịlas.
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.