Ozi Ọma Matiu Dere 5:1-48

  • IHE JIZỌS NỌ N’ELU UGWU KỤZIE (1-48)

    • Jizọs bidoro izi ndị mmadụ ihe n’elu ugwu (1, 2)

    • Ihe itoolu na-eme ka e nwee obi ụtọ (3-12)

    • Nnu na ìhè (13-16)

    • Jizọs bịara imezu Iwu Mosis (17-20)

    • Ndụmọdụ gbasara iwe (21-26), ịkwa iko (27-30), ịgba alụkwaghịm (31, 32), ịṅụ iyi (33-37), imegwara ihe (38-42), mmadụ ịhụ ndị iro ya n’anya (43-48)

5  Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ọ rịgooro n’elu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya.  O wee meghee ọnụ ya malite izi ha ihe, sị:  “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha* na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ha.  “Ndị na-eru uju na-enwe obi ụtọ, n’ihi na a ga-akasi ha obi.+  “Ndị dị nwayọọ n’obi na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na ha ga-eketa ụwa.+  “Ndị agụụ ezi omume na-agụ na ndị akpịrị ya na-akpọ nkụ+ na-enwe obi ụtọ, n’ihi na a ga-eme ka afọ ju ha.+  “Ndị na-eme ebere na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na a ga-emere ha ebere.  “Ndị obi ha dị ọcha na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na ha ga-ahụ Chineke.  “Ndị na-eme udo na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. 10  “Ndị a kpagburu n’ihi ezi omume na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ha. 11  “Unu na-enwe obi ụtọ mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu+ ma na-akpagbu unu,+ na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile na-abụghị eziokwu banyere unu n’ihi m.+ 12  Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ ezigbo obi ụtọ,+ n’ihi na ụgwọ ọrụ unu+ dị ukwuu n’eluigwe, n’ihi na otú a ka ha si kpagbuo ndị amụma bu unu ụzọ.+ 13  “Unu bụ nnu+ nke ụwa. Ma ọ bụrụ na nnu anaghịzi atọ ka nnu, olee otú a ga-esi mee ka ọ tọwakwa ka nnu? E nweghịkwa ike iji ya mee ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị ịwụfu ya n’èzí+ ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ. 14  “Unu bụ ìhè nke ụwa.+ E nweghị ike izo obodo ezo ma ọ bụrụ na ọ dị n’elu ugwu. 15  Ndị mmadụ na-amụnye ọkụ* ma dọsa ya n’elu ihe e ji adọsa ọkụ, ọ bụghị n’okpuru nkata. Ọ na-enwukwara ndị niile nọ n’ime ụlọ.+ 16  Ununwa kwa, meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ,+ ka ha hụ ọrụ ọma unu+ wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.+ 17  “Unu echekwala na m bịara ịkagbu Iwu Mosis ma ọ bụ ihe dị n’Akwụkwọ Ndị Amụma. M bịara imezu ha,+ ọ bụghị ịkagbu ha. 18  N’eziokwu, ana m asị unu na ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịla n’iyi karịa ihichapụ otu mkpụrụ akwụkwọ kacha nta ma ọ bụ otu kpọm dị ná mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu, ihe niile e dere n’ime ya agharakwa imezu.+ 19  N’ihi ya, onye ọ bụla nke na-emebi otu n’ime ihe ndị a kacha nta e nyere n’iwu ma na-akụziri ndị ọzọ ka ha na-eme otú ahụ, a ga-akpọ ya onye kacha nta n’ihe banyere Alaeze* eluigwe. Ma onye ọ bụla nke na-eme ha ma na-akụzi ha, a ga-akpọ ya onye ukwu n’ihe banyere Alaeze* eluigwe. 20  Ọ bụ ya mere m ji asị unu na ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị nke ndị odeakwụkwọ na nke ndị Farisii,+ o nweghị ihe ga-eme ka unu baa n’Alaeze eluigwe.+ 21  “Unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị: ‘Egbula mmadụ,*+ ma onye ọ bụla nke gburu mmadụ ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe.’+ 22  Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ewesa nwanne ya iwe+ ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe. Onye ọ bụla nke na-agwakwa nwanne ya okwu mkparị jọgburu onwe ya ga-aza ajụjụ n’Ụlọikpe Kacha Elu. Onye ọ bụla nke na-asịkwa, ‘Gị onye nzuzu na-abaghị uru!’ a ga-atụba ya na Gehena,* bụ́ ebe ọkụ na-ere.+ 23  “N’ihi ya, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà,+ i wee nọrọ ebe ahụ cheta na nwanne gị na-ewere gị iwe, 24  hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà. Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị kpezie, gaghachizie, nye onyinye gị.+ 25  “Mee ka gị na onye gbara gị akwụkwọ dozie okwu ọsọ ọsọ, mgbe gị na ya ka so na-aga n’ụlọikpe, ka onye ahụ gbara gị akwụkwọ ghara inyefe gị n’aka ọkàikpe, ọkàikpe enyefee gị n’aka onye nche ụlọikpe, e wee tụba gị n’ụlọ mkpọrọ.+ 26  N’eziokwu, ana m asị gị, ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụrụ obere mkpụrụ ego ikpeazụ* i nwere. 27  “Unu nụrụ na a sịrị: ‘Akwala iko.’+ 28  Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya,+ o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasola ya iko n’obi ya.+ 29  Ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i mehie,* ghụpụ ya tụfuo.+ N’ihi na ọ kaara gị mma ka otu anya gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị niile na Gehena.*+ 30  Ọ bụrụkwa na aka nri gị na-eme ka i mehie,* gbupụ ya tụfuo.+ N’ihi na ọ kaara gị mma ka otu aka gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị niile na Gehena.*+ 31  “A sịkwara: ‘Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ya nye ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm.’+ 32  Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko,* na-edowe ya n’ọnọdụ nwere ike ime ka ọ kwaa iko. Onye ọ bụla nke lụkwara nwaanyị a gbara alụkwaghịm* na-akwa iko.+ 33  “Unu nụkwara na a gwara ndị oge ochie, sị: ‘Ahapụla ime ihe ị ṅụrụ n’iyi,+ kama mezuo nkwa i kwere Jehova.’*+ 34  Ma, ana m asị unu: Aṅụla iyi ọ bụla.+ Ejikwala eluigwe aṅụ iyi, maka na ọ bụ ocheeze Chineke. 35  Ejikwala ụwa aṅụ iyi, maka na ọ bụ ihe o ji agbakwasị ụkwụ ya.+ Ejikwala Jeruselem aṅụ iyi, maka na ọ bụ obodo Eze ukwu.+ 36  Ejila isi gị aṅụ iyi, ebe ọ bụ na i nweghị ike ime ka otu ntutu chaa ọcha ma ọ bụ jie oji. 37  Naanị ka ‘Ee’ unu kwuru bụrụ ee, ka ‘Ee e’ unu kwuru bụrụ ee e,+ n’ihi na ihe gafere ihe ndị a si n’aka ajọ onye ahụ.+ 38  “Unu nụrụ na a sịrị: ‘Onye kụkpọrọ mmadụ anya, a ga-akụkpọ ya anya. Onye kụpụrụ mmadụ ezé, a ga-akụpụ ya ezé.’+ 39  Ma, ana m asị unu: Emegwarala ajọ mmadụ ihe o mere gị, kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.+ 40  Ọ bụrụkwa na mmadụ achọọ ịkpụga gị ụlọikpe ka o wee nara gị uwe ime gị, hapụkwuoro ya uwe elu gị.+ 41  Ọ bụrụkwa na onye nwere ikike amanye gị ịga otu maịl,* soro ya gaa maịl abụọ. 42  Mmadụ rịọ gị ihe, nye ya. Agbakụtakwala onye chọrọ ibiri gị ego* azụ.+ 43  “Unu nụrụ na a sịrị: ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya+ ma kpọọ onye iro gị asị.’ 44  Ma, ana m asị unu: Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya,+ na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu,+ 45  ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe,+ n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma. Ọ na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.+ 46  N’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu?+ Ọ̀ bụ na ndị ọnaụtụ anaghị eme otu ihe ahụ? 47  Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị ụmụnne unu ka unu na-ekele, olee oké ihe unu na-eme? Ọ̀ bụ na ndị mba ọzọ anaghị emekwa otu ihe ahụ? 48  N’ihi ya, unu kwesịrị izu okè otú Nna unu nke eluigwe zuru okè.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị na-arịọ ka e nye ha mmụọ nsọ.”
Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ya bụ, “onye na-erughị eru ịbanye n’Alaeze.”
Ya bụ, “onye ruru eru ịbanye n’Alaeze.”
Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”
Gehena bụ ebe a na-akpọ ihe ndị e kpofuru ekpofu ọkụ n’azụ mgbidi Jeruselem. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “mkpụrụ ego kwọdrans ikpeazụ.” Gụọ B14.
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, nwaanyị a gbara alụkwaghịm, ma, ọ bụghị n’ihi na ọ kwara iko.
Gụọ A5.
Gụọ B14.
Ya bụ, ibiri gị ego n’akwụghị ọmụrụ nwa.