Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME

Ibipụta Akwụkwọ Kacha Mkpa n’Ụwa

Ibipụta Akwụkwọ Kacha Mkpa n’Ụwa

JENỤWARỊ 1, 2021

 “Ọ bụ ihe a ka m na-atụ anya ya kemgbe afọ iri na itoolu.” Gịnị ka nwanna anyị a na-atụ anya ya? Ọ bụ ka e wepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ ya bụ́ Bengali. Ọtụtụ ndị na-ekwukarị ụdị ihe a ma e wepụta Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ha. Ma ì chetụla banyere ọrụ dị n’ịsụgharị na ibipụta Baịbụl ndị a?

 Ihe mbụ a na-eme bụ na Kọmitii Ide Ihe nke Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị nsụgharị ga-eso sụgharịa ya. Afọ ole ka ọ na-ewe ịsụgharị Baịbụl? Nicholas Ahladis, onye na-arụ ọrụ ná Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka, nke dị na Wọwik, Niu Yọk, sịrị: “E nwere ọtụtụ ihe na-ekpebi oge ọ ga-ewe. Ụfọdụ n’ime ha bụ, ndị nsụgharị ole e nwere ga-asụgharị ya, otú asụsụ ahụ siruru n’ike, otú ndị na-agụ asụsụ ahụ si aghọtaru ihe ndị mere n’oge e dere Baịbụl, nakwa ma è nwere ụzọ dị iche iche e si asụ asụsụ ahụ n’ebe dị iche iche. Ọ na-ewekarị ndị nsụgharị ihe dị ka otu afọ ruo afọ atọ iji sụgharịa naanị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ na-ewekwa ha afọ anọ ma ọ bụ karịa iji sụgharịchaa Baịbụl niile. Ọ bụrụ Baịbụl nke ndị ogbi, ọ na-ewe oge karịa.”

 Ọ bụghị naanị ndị nsụgharị ka a chọrọ mgbe a na-asụgharị Baịbụl. A chọkwara ndị na-abụghị ndị nsụgharị ga-agụ ihe a sụgharịrị. Ndị ahụ na-abụ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị si n’ebe dị iche iche a na-asụ asụsụ ahụ, ma ndị gụrụ akwụkwọ ma ndị na-agụghị. Mgbe ụfọdụkwa, ha na-esi ná mba dị iche iche. Ha na-agụgharị ihe a sụgharịrị ma kwuo ihe ha chọpụtara, a naghịkwa akwụ ha ụgwọ maka ọrụ a. Ihe ha kwuru na-enyere ndị nsụgharị aka ịsụgharị ihe ga-adị mfe nghọta, doo anya ma bụrụkwa eziokwu. Otu nwanna nọ na Saụt Afrịka, onye na-azụ ndị nsụgharị Baịbụl, kwuru na “ndị nsụgharị ma na ịsụgharị Baịbụl abụghị obere ọrụ. Ha ma na Jehova na ndị na-agụ Okwu ya na-atụ anya na ha ga-asụgharị ya nke ọma.”

 A sụgharịchaa Baịbụl, a ga-ebipụta ya. Lee ihe ụfọdụ na-adị mkpa iji bipụta ya: akwụkwọ, ink, ihe ndị e ji eme mkpo akwụkwọ, gọm, ribọn na ihe ndị a ga-eji adụkọta ya. N’afọ 2019, anyị mefuru ihe karịrị nde dọla iri abụọ ($20,000,000) iji zụta ihe ndị a e ji ebipụta Baịbụl. Ụmụnna ndị na-arụ ọrụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ anyị rụrụ ọrụ ihe karịrị narị puku awa atọ (300,000) n’afọ ahụ iji bipụta Baịbụl ndị a ma buga ha ebe a chọrọ ha.

“Baịbụl bụ akwụkwọ kacha mkpa anyị na-ebipụta”

 Gịnị mere anyị ji eji nnukwu ego na oge há otú a ebipụta Baịbụl? Nwanna Joel Blue, onye na-arụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ibi Akwụkwọ Anyị n’Ụwa Niile, kwuru, sị: “Baịbụl bụ akwụkwọ kacha mkpa anyị na-ebipụta. N’ihi ya, anyị chọrọ ka otú ọ ga-adị n’anya mee ka a na-eto Chineke anyị na-efe, chọọkwa ozi ọma anyị na-ekwusa mma.”

 E wezụga ibipụta Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke ndị na-ahụ ụzọ na-agụ, anyị na-ebipụtakwa ya n’ụdị ọzọ maka ndị nwere mkpa pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, anyị ebipụtala Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’asụsụ iri. Ọ na-ewe ihe ruru awa asatọ iji bipụta otu Baịbụl a. A na-ebipụta ya ná nkebi ná nkebi. A tụkọtachaa nkebi niile dị n’otu Baịbụl ndị ìsì ọnụ, ọ ga-aka mmadụ ogologo. Anyị na-ebipụtakwa Baịbụl ndị e ji akwụkwọ nkịtị mee mkpo ha maka ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ebe a na-anabata naanị ụdị akwụkwọ ndị ahụ.

 Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-abara ndị na-agụ ya ezigbo uru. Ihe mere n’ọgbakọ na-eji asụsụ Kiluba amụ ihe gosiri na ọ bụ eziokwu. Ọgbakọ a dị n’ebe a na-akpọ Tombe, nke dị na Kongo Kinshasa. Iji ụgbọala si Tombe gaa isi obodo Kongo Kinshasa na-ewe ihe karịrị awa iri na asaa. Ndịàmà Jehova nọ na Tombe nwere naanị otu Baịbụl e dere n’asụsụ Kiluba nke a na-asụ n’oge ochie. Ha na-eme otu nwanna jiri Baịbụl ahụ kwadebechaa ọmụmụ ihe, ya enyefee nwanna ọzọ. Ma kemgbe Ọgọst afọ 2018, ụmụnna niile na-eji asụsụ Kiluba amụ ihe enweela Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke e ji asụsụ Kiluba a na-asụ n’oge a dee.

 Legodị ihe otu nwanna nwaanyị na-asụ Jaman kwuru mgbe e wepụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke e degharịrị edegharị n’asụsụ ya. Ọ sịrị: Anaghịzi m ekwu na m kwesịrị ịgụ Baịbụl. Kama ihe m na-ajụzi onwe m bụ, “Olee mgbe m ga-agụkwu Baịbụl?” Otu onye mkpọrọ kwuru, sị: “Mmadụ nyere m Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ihe m na-agụta na ya na-emekwa ka ndụ m ka mma. Aghọtatụbeghị m Okwu Chineke otú m si na-aghọta ya ugbu a m na-agụ Baịbụl nke a. M ga-achọ ịmatakwu Ndịàmà Jehova, matakwa otú m ga-esi aghọ Onyeàmà Jehova.”

 Ndị niile na-agụ Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-enwe obi ụtọ maka onyinye ndị mmadụ na-enye ka e nwee ike ịna-ebipụta ya. Ndị mmadụ na-esi n’ụzọ dị iche iche e depụtara na donate.mt711.com enye onyinye maka ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile. I meela maka onyinye ị na-enye.