Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ì Jikerela Maka Ọgba Aghara Nwere Ike Ime n’Obodo?

Ì Jikerela Maka Ọgba Aghara Nwere Ike Ime n’Obodo?

Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, anyị na-atụ anya na a ga na-enwekwu ọgba aghara, ime mpụ, na agha. (Mkpu. 6:4) Olee otú anyị ga-esi jikere maka ihe ndị a?

  • Mee ka adịm ná mma gị na Jehova sikwuo ike: Chọpụta ndụmọdụ na akụkọ ndị dị na Baịbụl ga-eme ka ị tụkwasikwuo Jehova na nzukọ ya obi, ndị ga-emekwa ka ị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Ilu 12:5; jr 125-126 ¶23-24) Ugbu a bụ oge anyị ga-eji meta ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ.​—1 Pita 4:​7, 8

  • Wekọta ihe ndị dị mkpa: Kwadebe maka ịnọ n’ụlọ ruo ogologo oge. Wekọtakwa nri na ihe ndị ọzọ ga-adị gị mkpa. Haziekwa maka otú ị ga-esi gbapụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Chọpụta ma ì tinyela ihe niile ga-adị gị mkpa n’akpa ị ga-eji agbapụ; chetakwa tinye ihe ndị ị ga-eji echebe onwe gị na ego. Hazie otú ị ga-esi kpọtụrụ ndị okenye, jidekwa n’aka na ndị okenye ma otú ha ga-esi kpọtụrụ gị.​—Aịza. 32:2; g17.5 3-7

E nwee ọgba aghara, akwụsịla ime ihe ndị ị na-emebu n’ofufe Jehova. (Fil. 1:10) Nọrọ n’ụlọ gị. Apụtala apụta, ọ gwụla ma ị̀ chọrọ ịgbapụ. (Mat. 10:16) Nyetụ ndị ọzọ nri na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa.​—Rom 12:13

LEENỤ VIDIO BỤ́ Ì JIKERELA MAKA ỌDACHI?, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ma e nwee ọdachi?

  • Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji kwadebe maka ọdachi?

  • Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ma e nwee ọdachi?