Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Otú Ụkpara Si Anụ Ihe

Otú Ụkpara Si Anụ Ihe

ỤKPARA a e sere ebe a na-adịkwa n’Ebe Ndịda Amerịka. Ntị ya pere ezigbo mpe, ma ọ na-anụ ihe ka mmadụ. Ụkpara a na-anụ mkpọtụ si n’ebe dị ezigbo anya, marakwa ihe na-eme mkpọtụ ahụ ọ na-anụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-ama ma mkpọtụ ọ na-anụ ọ̀ bụ nke ụkpara ọzọ ka ọ̀ bụ nke ụsụ na-achọ ụkpara ọ ga-eri.

NTỊ ỤKPARA

Ihe ị ga-echebara echiche: Ebe ntị ụkpara a dị bụ n’aka ya abụọ dị n’ihu. Otú ahụ mmadụ si anụ mkpọtụ mara ihe na-eme mkpọtụ ahụ ka ụkpara a sị anụ mkpọtụ mara ebe o si na ihe na-eme ya. Ma, ndị ọkà mmụta achọpụtala ihe pụrụ iche ná ntị ụkpara a. Ha chọpụtara na e nwere oghere ihe dị ka mmiri juru nke dị ná ntị ụkpara a. Oghere ahụ yiri mbolombolo a dọtịrị adọtị. Ihe a ha chọpụtara nwere ihe o yiri ná ntị mmadụ, ma nke a dị ná ntị ụkpara a pere ezigbo mpe. Ọ bụ ihe a na-eme ka ụkpara a na-anụ ihe ka mmadụ.

E nwere ihe ndị ntị ike na-etinye ná ntị ka ha nwee ike ịna-anụ ihe nke ọma. Prọfesọ Daniel Robert sịrị na ihe a a chọpụtara ná ntị ụkpara a ga-enyere ndị ọkachamara aka ịrụpụta ihe ahụ ndị ntị ike na-etinye ná ntị ndị nke ga-epe mpe ma mee ka ha na-anụkwu ihe nke ọma. Ndị ọkachamara kwukwara na ihe a a chọpụtara ga-enye aka ịrụ ihe ga-eme ka ọ na-adịrị ndị dọkịta mfe ịhụ ihe dị n’ime ahụ́ mmadụ.

Gịnị ka i chere? Ụkpara a ọ̀ nọkatara dịrị ka e nwere onye kere ya?