Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE GA-ENYERE GỊ AKA IBELATA NCHEGBU

A Ga-enweli Ụwa Nchegbu Na-adịghị na Ya

A Ga-enweli Ụwa Nchegbu Na-adịghị na Ya

Ndụmọdụ dị na Baịbụl ga-enyere anyị aka izere nchegbu na-enweghị isi na ọdụ. Anyị agaghị ewepụli nchegbu anyị niile n’onwe anyị. Ma, Onye kere anyị ga-emeli ya. Ọ họpụtadịla Jizọs Kraịst ka ọ gbatara anyị ọsọ enyemaka. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-arụ ọrụ ebube n’ụwa niile karịadị otú ahụ ọ rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Dị ka ihe atụ:

JIZỌS GA-AGWỌ NDỊ ỌRỊA DỊ KA O MERE N’OGE MBỤ.

“Ha wee kpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa . . . o wee gwọọ ha.”​—MATIU 4:24.

JIZỌS GA-EME KA ONYE Ọ BỤLA NWEE ỤLỌ NA IHE ORIRI.

“Ha [ya bụ, ndị Kraịst ga-achị] ga-arụ ụlọ, birikwa na ha. Ha ga-akọ ubi vaịn, rie ihe si na ya. Ha agaghị arụ ụlọ, onye ọzọ ebichie ya, ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ihe si na ya.” ​—AỊZAYA 65:21, 22.

ỌCHỊCHỊ JIZỌS GA-EME KA UDO DỊ N’ỤWA NIILE.

“N’oge ọchịchị ya, ihe ga na-agaziri onye ezi omume, udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agaghịzi adị. Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị malite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri, malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo n’ebe niile ụwa sọtụrụ. . . . Ndị iro ya ga-arachakwa ájá.”​—ABỤ ỌMA 72:7-9.

JIZỌS GA-EME KA MMEGBU KWỤSỊ.

“Ọ ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere, ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye. Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”​—ABỤ ỌMA 72:13, 14.

JIZỌS GA-EME KA AHỤHỤ NA ỌNWỤ KWỤSỊ.

“Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”​—MKPUGHE 21:4.