Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-eme Ka Ihe Ndị I Nwere Na-eju Gị Afọ

Ihe Ga-eme Ka Ihe Ndị I Nwere Na-eju Gị Afọ

Anyị niile, ma ndị lụrụla di na nwunye ma ndị na-alụbeghị, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, chọrọ ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ, anyị ana-enwekwa obi ụtọ ná ndụ. Ihe a ka Chineke chọkwara maka anyị. N’ihi ya, o nyere anyị ndụmọdụ ndị ga-abara anyị uru.

Na-arụsi Ọrụ Ike

“Ka ọ na-arụsi ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ dị mma, ka o wee nwee ihe ọ ga-enye onye nọ ná mkpa.”​—NDỊ EFESỌS 4:28.

Chineke na-agba anyị ume ile ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị? Onye na-arụsi ọrụ ike na-enwe obi ụtọ n’ihi na ọ ga-enwe ike igbo mkpa ya na nke ndị ezinụlọ ya. O nwedịrị ike inyere onye ọzọ nọ ná mkpa aka. Onye ọ na-arụrụ ọrụ ga-ejikwa ya kpọrọ ihe. N’ihi ya, o yikarịrị ka a gaghị achụ ụdị onye a n’ọrụ. Otú Akwụkwọ Nsọ si kọwaa uru dị n’ịrụsi ọrụ ike dabara adaba. Ọ sịrị na ọ bụ “onyinye Chineke.”​—Ekliziastis 3:13.

Na-akwụwa Aka Gị Ọtọ

“Obi siri anyị ike na akọnuche anyị dị ọcha, anyị chọkwara ịna-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile.”​—NDỊ HIBRU 13:18.

Ọ bụrụ na anyị na-akwụwa aka anyị ọtọ, anyị ga na-enwe obi ụtọ n’ime onwe anyị. Obi ga na-eru anyị ala, anyị ga na-ehikwa ụra nke ọma n’abalị. Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ ga na-atụkwasị anyị obi ma na-akwanyere anyị ùgwù. Ndị na-anaghị akwụwa aka ha ọtọ anaghị enweta ihe ọma ndị a. Akọnuche ha nwekwara ike ịna-apịa ha ụtarị, ụjọ ana-atụkwa ha na otu ụbọchị, iko ha ga-eju.

Ekwela Ka Ego Bụrụ Ihe Kacha Gị Mkpa ná Ndụ

“Ka otú unu si ebi ndụ gosi na unu ahụghị ego n’anya, kama ka ihe ndị dị ugbu a ju unu afọ.”​—NDỊ HIBRU 13:5.

Ego dị anyị mkpa iji zụta nri na ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa. Ma, “ịhụ ego n’anya” dị njọ. O nwere ike ime ka mmadụ jiri ike ya niile na oge ya niile na-achọ inwetakwu ego. Mmadụ isi otú a na-achụ ego ọnwụ ọnwụ nwere ike ịkpaghasị ezinụlọ ya, mee ka ya na ụmụaka ya ghara ịna-anọ, kpatakwara ya ọrịa. (1 Timoti 6:​9, 10) Ihe ọzọ bụ na onye hụrụ ego n’anya nwere ike ịchọwa ịrụrụ aka iji nweta ego. Otu nwoke nwere amamihe kwuru, sị: “Ọtụtụ ngọzi ga-abịara onye a tụkwasịrị obi, ma onye na-achọ ka ọ baa ọgaranya ngwa ngwa ga-etinyerịrị aka n’ihe ọjọọ.”​—Ilu 28:20.

Họrọ Agụmakwụkwọ Kacha Mma

“Jidesie ezigbo amamihe aka ike, na-echebakwara ihe echiche nke ọma.”​—ILU 3:21.

Ezigbo agụmakwụkwọ na-enyere mmadụ aka ịbụ onye e nwere ike ịtụkwasị obi, nakwa ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ nna. Ma, naanị mmadụ ịgụ akwụkwọ nke ọma n’ụlọ akwụkwọ agaghị eme ka onye ahụ na-enweta ihe ndị dị ya mkpa mgbe niile ma na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe gaziere anyị n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ, agụmakwụkwọ nke si n’aka Chineke dị anyị mkpa. Akwụkwọ Nsọ kwuru otú ihe ga-adịrị onye na-ege Chineke ntị. Ọ sịrị: “Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”​—Abụ Ọma 1:​1-3.