Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkpọasị Bụ Ọrịa, Ì Bu Ya?

Ịkpọasị Bụ Ọrịa, Ì Bu Ya?

Ịkpọasị dị ka ọrịa. Ọ na-enye ndị na-arịa ya nsogbu. Ma, o nwere ike ha agaghị ama na ha bu ya.

Ndị mmadụ na-akpọ ndị obodo ọzọ, agbụrụ ọzọ ma ọ bụ asụsụ ọzọ asị. Ha na-akpọkwa ndị ọzọ asị n’ihi okpukpe ha, n’ihi na ha bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ma ọ bụkwanụ na ha ji ego ma ọ bụ daa ogbenye. E nwekwara ndị na-ele ndị ọzọ anya ọjọọ n’ihi afọ ole ha dị, ebe ha gụruru n’akwụkwọ, na ha nwere nkwarụ, ma ọ bụ otú ha dị n’ile anya. N’agbanyeghị ya, ọ naghị adị ha ka hà kpọrọ ndị ọzọ asị.

Ò nwere ike ịbụ na ị kpọrọ ndị ọzọ asị? Ọtụtụ n’ime anyị nwere ike ịchọpụta na mmadụ kpọrọ onye ọzọ asị. Ma, anyịnwa kpọ mmadụ asị, o nwere ike isiri anyị ike ịchọpụta ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwetụrụ otú onye ọ bụla n’ime anyị si kpọ ndị ọzọ asị. Otu prọfesọ aha ya bụ David Williams kwuru na ọ bụrụ na e nwee obodo mmadụ na-ele anya ọjọọ, ọ hụ onye obodo ahụ, “otú o si emeso onye ahụ ihe na-adị iche. Ọ naghịkwanụ ama na o si otú ahụ meso ya ihe.”

Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwoke aha ya bụ Jovica bi n’otu obodo dị na Yurop. N’obodo ahụ, e nwere otu agbụrụ ọtụtụ ndị kpọrọ asị. Jovica sịrị: “M cheburu na e nweghị onye agbụrụ ahụ bụ́ ezigbo mmadụ. Ma, ọ dịghị m ka è nwere onye m kpọrọ asị n’ihi na m chere na m ma nke bụ́ eziokwu gbasara ha.”

Ọtụtụ obodo tiri iwu ka a kwụsị ịkpa ókè agbụrụ na ịkpọasị n’ụdị ya dị iche iche. Ma, o mebeghị ka ịkpọasị kwụsị. N’ihi gịnị? N’ihi na iwu ndị ahụ kwuru naanị gbasara ihe mmadụ na-agaghị eme. Ha ekwughị gbasara ihe mmadụ na-eche n’obi ya. Ma, ọ bụ n’obi ka ịkpọasị na-ebido. Ọ̀ pụtaziri na ịkpọasị agaghị akwụsịli? È nwere ihe ga-emeli ka ịkpọasị kwụsị?

N’isiokwu ndị na-esonụ, a ga-ekwu gbasara ihe ise nyeerela ọtụtụ ndị aka iwepụ ịkpọasị n’obi ha.