Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Ike Hapụ Ile Naanị Otú Mmadụ Dị?

Ì Nwere Ike Hapụ Ile Naanị Otú Mmadụ Dị?

OTU Onyeàmà Jehova bi na Kanada aha ya bụ Don na-agba ezigbo mbọ izi ndị na-enweghị ebe ha bi ozi ọma. O kwuru banyere otu n’ime ha, sị: “Otu nwoke aha ya bụ Peter enweghị ebe o bi. O so ná ndị kacha ruo unyi m hụtụrụla n’ebe ruru unyi. Ọ na-akparị ndị mmadụ, na-emekwa ka a na-agbara ya ọsọ. Ọtụtụ ndị agbalịala imere ya ihe ọma, ya ajụwapụ isi.” Ma, ruo ihe karịrị afọ iri na anọ, Don weturu obi na-agbalị mgbe ụfọdụ imere nwoke ahụ ihe ọma.

Otu ụbọchị, Peter jụrụ Don, sị: “Gịnị mere i ji enye onwe gị nsogbu maka m? Onye ọ bụla hapụrụ m. Gịnị mere ihe m ji masị gị?” Don ji amaokwu Baịbụl atọ gbalịa ikwu ihe ga-aba Peter n’obi. Nke mbụ, ọ jụrụ Peter ma ọ̀ ma na Chineke nwere aha, gwakwa ya ka ọ gụọ ya na Baịbụl n’Abụ Ọma 83:18. Nke abụọ, Don gwara Peter ka ọ gụọ Ndị Rom 10:13, 14, bụ́ ebe kwuru na “onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” O ji ya gosi Peter ihe mere ihe ya ji masị ya. Ebe ikpeazụ Don gụụrụ Peter bụ Matiu 9:36, gwazie ya ka o jiri aka ya gụọ ya. Ebe ahụ sịrị: ‘Mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ Anya mmiri juru Peter n’anya, ya ajụọ, sị: “M̀ so n’atụrụ ndị a?”

Peter malitere ịgbanwe. Ọ sara ahụ́, kpụlata afụ ọnụ ya, yirikwa uwe dị mma n’anya Don nyere ya. Peter akwụsịghị ịna-adị ọcha.

Peter nwere akwụkwọ o ji ede ihe ndị mere n’ụbọchị. Ihe ndị o dere ná mmalite akwụkwọ ahụ anaghị eme obi ụtọ. Ma ihe ndị o mechara dee adịghị otú ahụ. E nwere ebe o dere, sị: “M mụtara aha Chineke taa. Ọ bụzi Jehova ka m na-agwa okwu ma m kpewe ekpere. Obi atọgbuola m na m matara aha ya. Don kwuru na Jehova ga-abụli ezigbo Enyi m, onye na-ewepụta oge gee m ntị mgbe ọ bụla, ihe ọ sọrọ ya bụrụ.”

N’ihe ikpeazụ Peter dere n’akwụkwọ ahụ, ọ sịrị ụmụnne ya:

“Ahụ́ adịghị m taa. Ama m na nká abịala. Ma, ọ bụrụgodị na taa bụ ụbọchị ikpeazụ m, ama m na m ga-ahụ enyi m Don ọzọ na Paradaịs. Ọ bụrụ na ị na-agụ ihe a m dere, ọ pụtara na anọghịzi m. Ma, ị bịa olili m hụ nwoke yiri ka ọ̀ gbapụrụ iche, gwa ya okwu. Biko, gụọ obere akwụkwọ a na-acha anụnụ anụnụ. * O kwuru na m ga-ahụ enyi m ọzọ na Paradaịs. M ji obi m niile kweta. Abụ m ezigbo nwanne unu, bụ́ Peter.”

Mgbe e lichara Peter, nwanne ya nwaanyị bụ́ Ummi kwuru, sị: “Peter kpọtụụrụ m ihe dị ka afọ abụọ gara aga. Kemgbe ọtụtụ afọ, nke ahụ bụ nke mbụ m na-ahụ ebe obi dị ya ụtọ. Ọ chịdịrị ọchị.” Ummi gwara Don, sị: “M ga-agụ akwụkwọ ahụ n’ihi na ihe ọ bụla mere ka nwanne m gbanwee ga-abụrịrị ihe pụrụ iche.” Ummi kwetakwara ka Onyeàmà Jehova mụwara ya akwụkwọ nke e bipụtara n’oge na-adịchabeghị anya, a na-akpọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Anyịnwa ekwesịghị ịna-ele naanị otú mmadụ dị. Anyị kwesịrị ịhụ ndị ọzọ n’anya n’eziokwu, na-enwekwara ụdị mmadụ niile ndidi. (1 Tim. 2:3, 4) Anyị mee otú ahụ, anyị nwere ike ime ka ndị dị ka Peter gbanwee, ndị dị nkịrịka n’anya ma nwee ezigbo obi. Ka obi sie anyị ike na Chineke, bụ́ onye “na-ahụ ihe dị n’obi,” ga-eme ka eziokwu Baịbụl ruo n’obi ndị nwere ezi obi.—1 Sam. 16:7; Jọn 6:44.

^ para. 7 Aha akwụkwọ ahụ bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Ọ bụ Ndịàmà Jehova biri ya. Ma a naghịzi ebipụta ya.