Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Uru Ịmata Onye Chineke Bụ Ga-abara Gị?

Olee Uru Ịmata Onye Chineke Bụ Ga-abara Gị?

Ugbu a, o doro anya na anyị amatala azịza ajụjụ bụ́: Ònye Bụ Chineke? Anyị esila na Baịbụl mụta na aha ya bụ Jehova nakwa na àgwà ya kacha pụta ìhè bụ ịhụnanya. Anyị tụlekwara ihe ndị o meerela anyị nakwa ihe ndị ọ ka ga-emere anyị. Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe ndị anyị ga-amụtakwu banyere Chineke, ma olee uru ịmụta ihe ndị ahụ ga-abara gị?

Jehova kwere nkwa na “ọ bụrụ na ị chọọ ya, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya.” (1 Ihe E Mere 28:9) Chegodị uru ị ga-erite ma ị gbalịa ka ị mata onye Chineke bụ ma mata ya. Gị na ya ga-enwe “mmekọrịta chiri anya.” (Abụ Ọma 25:14) Olee uru ịbụ enyi Chineke ga-abara gị?

Ị ga-enwe ezigbo obi ụtọ. Baịbụl kwuru na Jehova bụ “Chineke bụ́ onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Ọ bụrụ na gị na ya adịrị ná mma, gị ana-eṅomikwa ya, ọ ga-eme ka i nwee ezigbo obi ụtọ, obi eruo gị ala, ahụ́ agbasiekwa gị ike. (Abụ Ọma 33:12) Ị ga na-enwekwa obi ụtọ ná ndụ gị ma ọ bụrụ na i zere ihe ndị ga-akpatara gị nsogbu, na-akpa àgwà dị mma ma gbalịakwa na-eme ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma. N’eziokwu, ị ga-ahụ na ihe otu ọbụ abụ kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma.”—Abụ Ọma 73:28.

Ọ ga na-elekọta gị nke ọma. Jehova kwere ndị na-efe ya nkwa, sị: “M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.” (Abụ Ọma 32:8) Nke ahụ pụtara na Jehova na-elekọta ndị na-efe ya ma na-egboro ha mkpa ha n’otu n’otu. (Abụ Ọma 139:1, 2) Ọ bụrụ na gị na Jehova adịrị ná mma, ị ga-ahụ na o nweghị mgbe ọ ga-ahapụ gị.

Ọdịnihu gị ga-adị mma. Ọ bụghị naanị na Chineke ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ ná ndụ, kamakwa, ọ ga-eme ka i nwee ọdịnihu magburu onwe ya. (Aịzaya 48:17, 18) Baịbụl kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’oge a nsogbu juru ebe niile, olileanya Chineke na-enye anyị dị ka arịlịka nke ga-eme ka anyị ‘guzosie ike.’—Ndị Hibru 6:19.

Ihe ndị a bụ uru ole na ole anyị ga-erite ma anyị mara Chineke nke ọma ma bụrụ enyi ya. Anyị na-agba gị ume ka ị gaa na jw.org, ma ọ bụkwanụ gị agakwuru Onyeàmà Jehova ọ bụla ma ị chọọ ịmatakwu gbasara Chineke na ihe ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu.