Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Ndụ Ị Dị Ka Ji Nwee Isi

Ihe Mere Ndụ Ị Dị Ka Ji Nwee Isi

O nwere otu nwoke aha ya bụ Faizal. Ihe dị ka otu afọ nwunye ya nwụchara, a gwara ya na a ga-awa ya obi. O kwuru, sị: “Mgbe m gụrụ akwụkwọ Job, m ma na o nwere ihe mere Jehova ji tinye ya na Baịbụl. Anyị gụọ gbasara ndị nwere ụdị nsogbu anyị nwere a kọrọ gbasara ha na Baịbụl, ọ na-akasi anyị obi.” O kwukwara, sị: “Ndụ anyị dị ka nwere isi.”

Otu nwaanyị aha ya bụ Tarsha ka bụ nwata mgbe nne ya nwụrụ. O kwuru, sị: “Ịmata Onye kere anyị na-eme ka anyị nwee olileanya, ndụ anyị enwee isi, anyị ana-enwekwa obi ụtọ n’agbanyeghị ọtụtụ nsogbu anyị nwere. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga na-akwado anyị ma na-enyere anyị aka kwa ụbọchị.”

ISIOKWU ndị bu nke a ụzọ gosiri otú ihe ndị na-agbawa obi nwere ike isi mee ka ike ụwa gwụ mmadụ. Ka gị na nsogbu na-alụ, i nwekwara ike ịna-eche ma ndụ ị dị ọ̀ ka nwere isi ma ọ bụdị ma ò nwekwara onye ma ihe ị na-agabiga. Ka obi sie gị ike na Chineke ma ihe ị na-edi. O jighị gị egwu egwu.

Onye dere Abụ Ọma nke iri asatọ na isii kwuru ihe gosiri na ọ tụkwasịrị Chineke obi. Ọ sịrị: “M ga-akpọku gị n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ, n’ihi na ị ga-aza m.” (Abụ Ọma 86:7) Ma, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú Chineke ga-esi za mụnwa “n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ”?’

Ọ bụ eziokwu na e nwere ike Chineke agaghị eme ka nsogbu gị kwụsị ozugbo, ma o si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl na-eme ka obi sie gị ike na ọ ga-emeli ka obi ruo gị ala idi ya. O kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.” (Ndị Filipaị 4:​6, 7) Biko, legodị otú amaokwu Baịbụl ndị a si eme ka obi sie anyị ike na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi.

Ihe Banyere Gị Na-emetụ Chineke n’Obi.

“A dịghị echefu otu n’ime [nza] n’ihu Chineke. . . . Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”​Luk 12:​6, 7.

CHEGODỊ IHE A: Chineke ji nnụnụ ndị o yiri ka o nweghị uru ha bara, dị ka nza, kpọrọ ihe. O nweghịdị otu n’ime ha Chineke na-anaghị ahụ. Nke ọ bụla n’ime ha dị oké ọnụ ahịa n’anya ya. Ma, Chineke ji ụmụ mmadụ kpọrọ ihe karịa nza. Ụmụ mmadụ pụrụ iche n’ime ihe niile Chineke kere n’ụwa. O kere ha “n’onyinyo” ya, ha ga-amụtalikwa ọmarịcha àgwà ndị o nwere.​—Jenesis 1:​26, 27.

‘Jehova, i nyochawo m, ị makwaara m. . . . Ị na-atụle ihe m na-eche. . . . Nyochaa m, marakwa nchegbu m.’​Abụ Ọma 139:​1, 2, 23.

CHEGODỊ IHE A: Chineke ma gị nke ọma. Ọ ma otú obi dị gị na ihe niile na-echegbu gị. N’agbanyeghị na e nwere ike ndị ọzọ aghọtaghị nsogbu gị, ihe gbasara gị na-emetụ Chineke n’obi, ọ chọkwara inyere gị aka. N’ihi ya, ndụ ị dị ka nwere isi.

Ndụ Ị Dị Bara Uru

“Jehova, biko, nụrụ ekpere m; nụrụkwa ákwá enyemaka m na-akwa. . . . Tọọrọ m ntị n’ala; n’ụbọchị m kpọkuru gị, mee ngwa za m. . . . Ọ ga-eche ntị nụrụ ekpere nke ndị a napụrụ ihe niile.”​Abụ Ọma 102:​1, 2, 17.

CHEGODỊ IHE A: Kemgbe ụmụ mmadụ bidoro tawa ahụhụ, Jehova na-ahụ anya mmiri niile ahụhụ ha na-ata kpataara ha. (Abụ Ọma 56:8) Jehova na-ahụkwa anya mmiri gị. Chineke na-echeta nsogbu niile ị na-enwe na anya mmiri gị niile, n’ihi na ị dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.

“Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka. . . . Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, . . . ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’” ​Aịzaya 41:​10, 13.

CHEGODỊ IHE A: Chineke dị njikere inyere anyị aka. Ọ bụrụ na nsogbu emee ka ike ụwa gwụ gị, ọ ga-enyere gị aka.

E Nwere Olileanya na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu

“N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”​Jọn 3:16.

CHEGODỊ IHE A: Ị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. Ọ bụ ya mere o ji nye Ọkpara ya bụ Jizọs ka o jiri ndụ ya chụọ àjà n’ihi gị. Ọ bụ àjà a mere ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ndụ ga na-atọ gị ezigbo ụtọ. a

Ọ bụ eziokwu na nsogbu nwere ike izu gị ahụ́, ya adị gị ka ị gaghịzi edili ya, ma gbalịa mụọ Okwu Chineke nke ọma, nweekwa okwukwe na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere. I mee otú ahụ, ị ga-enwe obi ụtọ, obi esiekwa gị ike na ndụ ị dị ka nwere isi.

a Ị chọọ ịmụtakwu otú àjà Jizọs chụrụ ga-esi bara gị uru, lee obere vidio a isiokwu ya bụ Na-echeta Ọnwụ Jizọs. Ọ dị na www.mt711.com/ig. Gaa n’ebe e dere GBASARA ANYỊ, pịa ebe e dere NCHETA ỌNWỤ JIZỌS.