Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?

Otú Baịbụl Si Ghara Irekasị

Otú Baịbụl Si Ghara Irekasị

NSOGBU E NWERE: Ndị mbụ dere Baịbụl na ndị ji aka depụtaghachi ya n’oge ochie ji papaịrọs na akpụkpọ anụ e ji ede ihe dee ha. * (2 Timoti 4:13) Olee otú ihe ndị a ha ji dee Baịbụl si mee ka o sie ike ichekwa Baịbụl?

Papaịrọs anaghị ara ahụ́ adọwa. Ọ na-achagharị ma na-emebi ngwa ngwa. Richard Parkinson na Stephen Quirke, bụ́ ndị ọkachamara na-amụ gbasara Ijipt oge ochie, kwuru na “papaịrọs nwere ike iji nwayọọ nwayọọ gbarie ma ghọọ ntụ. A pịakọtachaakwa ha, dowe ha n’ebe jụrụ oyi, ha na-ebido mawa ebu ma ọ bụ rekasịwa.” Ha sịkwara na “òké ma ọ bụ ahụhụ ndị ọzọ nwere ike ịta ha ma e lie ha n’ala.” Mgbe a chọtara ụfọdụ papaịrọs, e dowere ha n’ebe anwụ ma ọ bụ mmiri mere ka ha mebie ngwa ngwa.

Akpụkpọ anụ e ji ede ihe na-anọte aka karịa papaịrọs. Ma ọ na-emebikwa ma ọ bụrụ na e jizighị ya ejizi ma ọ bụ dowe ya n’ebe dị́ mmiri mmiri ma ọ bụ n’anwụ. * Ụmụ ahụhụ na-atakwa ya. Ọ bụ ya mere na ọtụtụ akwụkwọ ndị e nwere n’oge ochie adịghịzi taa. Á sị na Baịbụl rekasịrị, anyị agaraghị amata ihe e dere na ya.

OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE: N’oge ochie, Chineke nyere ndị Juu iwu na onye ọ bụla e chiri eze “ga-edepụtara onwe ya” akwụkwọ ise mbụ dị́ na Baịbụl. (Diuterọnọmi 17:18) Ka ọ na-erukwala n’oge ndịozi Jizọs, ndị ọkachamara n’idepụta ihe ejirila ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta depụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, nke mere e ji nwee Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ dị iche iche n’Izrel nakwa n’obodo Masedonia dị́ anya ma e si Izrel gawa ya. (Luk 4:16, 17; Ọrụ Ndịozi 17:11) Olee otú e si chekwaa ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ha adịrị ruo taa?

Ọtụtụ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ dịgidere ruo ọtụtụ narị afọ n’ihi na e tinyere ha n’ite ụrọ ma dowe ha n’ime ọgba n’ọzara

Otu ọkachamara aha ya bụ Philip W. Comfort, onye na-amụ gbasara Agba Ọhụrụ, kwuru na “ndị Juu na-etinyekarị akwụkwọ mpịakọta n’ime ite ụrọ ka ọ ghara imebi.” Ọ ga-abụ na Ndị Kraịst nọ́ n’oge ahụ mewekwara otu ihe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji hụ ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl n’ime ite ụrọ dị iche iche, nakwa n’ebe gbara itiri a na-edowe ákwà, n’ọgba nakwa n’ọzara.

URU Ọ BARA: E nwere ọtụtụ puku akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ka dịnụ taa. Ụfọdụ n’ime ha adịwala kemgbe ihe karịrị puku afọ abụọ. O nweghị akwụkwọ mpịakọta ọzọ dịrurula afọ ole a a ka nwere ọtụtụ n’ime ha otú a.

^ para. 3 Papaịrọs bụ ụdị akwụkwọ e ji ahịhịa papaịrọs na-eto n’akụkụ mmiri mee.

^ para. 5 Dị ka ihe atụ, e ji akpụkpọ anụ e ji ede ihe dee ihe ndị Amerịka kwekọrịtara mgbe ha ghọrọ mba kwụụrụ onwe ya. O rubeghị narị afọ abụọ na iri ise kemgbe e dere ya, ma o mebiela nke na ọ na-esizi ike ịhụ ihe e dere na ya.