Gaa n'Isiokwu

Mpempe Akwụkwọ Dị n’Okpuru Ígwè E Ji Asa Ákwà

Mpempe Akwụkwọ Dị n’Okpuru Ígwè E Ji Asa Ákwà

 Mgbe e mechara Zarina baptizim ya aghọọ Onyeàmà Jehova, o si na Rọshịa laghachi n’obodo ya dị n’Eshia. O kpebisiri ike inyere ụmụ ya nwaanyị abụọ aka ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova. N’ihi otú ihe si siere ya ike, o sooro nne ya na nna ya na nwanne ya nwoke na nwunye ya biri n’otu ọnụ ụlọ ha bi. Ndị mụrụ ya nyere ya iwu ka ọ ghara ịkụziri ụmụ ya Baịbụl. Ha gwakwara ụmụ ya ka ha na mama ha ghara ikwurịta gbasara Baịbụl.

 Zarina chere otú ọ ga-esi nyere ụmụ ya aka ka ha mụta gbasara Jehova. (Ilu 1:8) O kpere ekpere rịọ Jehova ka o duzie ya ma nyere ya aka. Zarina meweziri ihe o kpere n’ekpere. Otú o si na-eme ya bụ ịkpọrọ ụmụ ya ma o mewe mkpapụ. Ọ na-eji ohere ahụ akụziri ha gbasara ihe ndị dị ebube Chineke kere. Ihe a mere ka ụmụ ya nwee mmasị n’Onye Okike.

 Ihe ọzọ Zarina mere bụ ịchọta otú ọ ga-esi mee ka mmasị ahụ ha nwere sikwuo ike. O ji akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? a kụziere ha ihe. O si n’akwụkwọ ahụ depụta paragraf ụfọdụ na ajụjụ ha ná mpempe akwụkwọ. Ọ gbakwụnyere ahịrịokwu ụfọdụ na paragraf ndị ahụ o depụtara ka o nwee ike ịdịrị ha mfe ịghọta ya. Ọ na-ewerezi mpempe akwụkwọ ahụ na pensụl o ji dee ihe zoo n’okpuru ígwè e ji asa àkwà nke dị n’ebe a na-anọ asa ahụ́. Ụmụ ya banye n’ebe a na-asa ahụ́, ha na-agụ ya ma dee azịza ha.

 Otú a Zarina si eme ihe a mere ka o nwee ike ịmụrụ ụmụ ya isiokwu abụọ n’akwụkwọ Bible Na-akụzi tupu ya na ụmụ ya akwagazie ebe ọzọ. N’ebe a ha kwagaziri, o nweziiri onwe ya ịzụ ụmụ ya n’enweghị nsogbu. N’ọnwa Ọktoba afọ 2016, e mere ụmụ ya abụọ ahụ baptizim. Obi dịkwa ha ụtọ na mama ha ji amamihe na akọ mee ihe ga-enyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma.

a Ọ bụzi akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? ka e ji amụrụ ọtụtụ ndị ihe taa