Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eji Obe Ekpere Chineke?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eji Obe Ekpere Chineke?

 Ọtụtụ ndị weere obe ka ihe e ji mara Ndị Kraịst. Ndịàmà Jehova bụ Ndị Kraịst, ma ha anaghị eji obe efe Chineke. Gịnị kpatara ya?

 Otu ihe kpatara ya bụ na ihe e dere na Baịbụl gosiri na Jizọs anwụghị n’elu obe, kama, ọ nwụrụ n’elu otu ogwe osisi kwụ ọtọ. Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl dọsiri Ndị Kraịst aka ná ntị ike ka ha ‘gbaara ikpere arụsị ọsọ.’ Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na anyị ekwesịghị iji obe na-efe Chineke.​—1 Ndị Kọrịnt 10:14; 1 Jọn 5:​21.

 Jizọs kwuru ihe a ga-eji mara Ndị Kraịst. Ọ sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ bụ ezigbo ịhụnanya ka a ga-eji amata ezigbo ndị na-eso ụzọ ya, ọ bụghị obe ma ọ bụ ihe oyiyi ọ bụla ọzọ.