Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Na-enye Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri?

Ndịàmà Jehova Hà Na-enye Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri?

 Mba, Ndịàmà Jehova anaghị enye otu ụzọ n’ụzọ iri. Ọ bụ ego ndị anyị nwetara n’onyinye ka anyị na-eji akwado ọrụ anyị. Anyị anaghịkwa akpọ aha ndị nyere onyinye ndị ahụ. Gịnị bụ otu ụzọ n’ụzọ iri, gịnịkwa mere Ndịàmà Jehova anaghị enye ya?

 Inye otu ụzọ n’ụzọ iri so n’iwu Chineke nyere ụmụ Izrel n’oge ochie. Ma, Baịbụl mere ka o doo anya na Ndị Kraịst anọghịzi n’okpuru iwu ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel. ‘Iwu otu ụzọ n’ụzọ iri’ sokwa na ya.​—Ndị Hibru 7:​5, 18; Ndị Kọlọsi 2:​13, 14.

 Kama anyị ga-anawa ụmụnna anyị otu ụzọ n’ụzọ iri ma ọ bụ nawa ha onyinye, e nwere ihe abụọ Ndị Kraịst oge mbụ mere, nke anyị na-emekwa ka ọrụ anyị na-aga aga. Nke mbụ bụ na anyị anaghị ana ego maka ịga kwusaa ozi ọma, ọzọkwa abụrụ na anyị na-enye onyinye si anyị n’obi.

 Ihe anyị na-eme bụ ihe Baịbụl kwuru ka Ndị Kraịst na-eme. Baịbụl sịrị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”​—2 Ndị Kọrịnt 9:7.