Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ́BÁ AKWỤKWỌ WATCHTOWER

Tinye Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower

Tinye Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower

I nwere ike ime ka Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower gị na-agwa gị mgbe e nwere ihe ọhụrụ e tinyere na ya ma ọ bụkwanụ gị ejiri aka gị jiri ihe e ji etinye ihe ọhụrụ tinye akwụkwọ na isiokwu ndị ọhụrụ e nwere.

Mee Ka Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower Na-agwa Gị Mgbe E Nwere Ihe Ọhụrụ

Ị chọọ ka Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower na-agwa gị mgbe e nwere akwụkwọ ma ọ bụ isiokwu ọhụrụ e tinyere n’Ịntanet, mee ihe ndị a.

  1. N’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower, pịa Library, pịzie Properties ka o mepee Properties for Library.

  2. N’igbe Properties for Library, pịa Updates, họrọzie Download updates automatically.

  3. Mgbe ọ bụla e tinyere ihe ọhụrụ, ị ga-ahụ ozi ga-ajụ gị ma ị̀ ga-achọ iwere ya. Pịa Yes ka ihe ọhụrụ ndị ahụ nwee ike ịbata n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower.

Jiri Aka Gị Tinye Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower

I nwere ike iji aka gị were ihe e ji etinye ihe ọhụrụ n’Ịntanet tinye ihe ọhụrụ e nwere n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower gị. Ị ga-enweta ihe e ji etinye ihe ọhụrụ nke kacha ọhụrụ n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower nke kacha ọhụrụ ma ọ bụkwanụ gị apịa ebe e dere Were Ya n’okpuru ebe a.

Otú E Si Enweta Ihe E Ji Etinye Ihe Ọhụrụ

Ị chọọ imepe ebe ị ga-edewe ihe e ji etinye ihe ọhụrụ n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower, mee ihe ndị a:

  1. N’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower, pịa Help, pịzie Manually Update Package na Create Package.

  2. Họrọ ebe ị ga-edewe ihe e ji etinye ihe ọhụrụ na kọmputa gị, pịzie Save. Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower ga-ewepụtara gị ihe e ji etinye ihe ọhụrụ. Ị ga-ahụ “.updatepkg” ná ngwụcha aha ya.

Were Ihe E Ji Etinye Ihe Ọhụrụ

Pịa ebe e dere Were Ya n’okpuru ebe a iji mara ma è nwere ihe ọhụrụ e tinyere n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower n’asụsụ gị. Ọ bụrụ na e nwere, mee ihe dị n’ozi ga-apụta iji tinye ihe e ji etinye ihe ọhụrụ na kọmputa gị.

Otú E Si Etinye Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere

Ị chọọ iji aka gị jiri ihe e ji etinye ihe ọhụrụ tinye ihe ọhụrụ ndị e nwere n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower, mee ihe ndị a:

  1. N’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower, pịa Help, pịzie Manually Update Package na Apply Package.

  2. N’igbe ọ ga-emepere gị, chọọ ihe e dere ihe a “.updatepkg” ná ngwụcha ya. Gaa na ya pịa Open ka i nwee ike itinye ihe ọhụrụ ndị ahụ n’Ọ́bá Akwụkwọ Watchtower.