Gaa n'Isiokwu

Ọ̀ Bụ Chineke Kere Ekwensu?

Ọ̀ Bụ Chineke Kere Ekwensu?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl gosiri na o nweghị onye Chineke kere, gụọ ya Ekwensu. Kama, o kere mmụọ ozi nke mechara bụrụ Ekwensu. Baịbụl kwuru na ọrụ Chineke zuru okè, nakwa na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi. Ọ kpọkwara ya Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ, onye ezi omume, na onye ziri ezi. (Diuterọnọmi 32:3-5) Ihe a Baịbụl kwuru mere ka anyị ghọta na mgbe Ekwensu ka bụ mmụọ ozi Chineke, o zuru okè ma na-eme ezi omume.

 Na Jọn 8:44, Jizọs kwuru na Ekwensu ‘eguzosighị ike n’eziokwu.’ Ihe a Jizọs kwuru gosiri na o nweburu mgbe Ekwensu na-ekwu eziokwu ma na-eme sọọsọ ihe ọma.

 Chineke kere ndị mmụọ ozi niile ka ha jiri aka ha kpebie ma hà ga-eme ihe ọma ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ. Onye a mechara bụrụ Ekwensu so ná ndị e kere otú ahụ. Ma, ebe ọ bụ na o kpebiri inupụrụ Chineke isi, meekwa ka Adam na Iv soro ya nupụrụ Chineke isi, o mere onwe ya Setan. Setan pụtara “Onye Mmegide.”—Jenesis 3:1-5; Mkpughe 12:9.