Gaa n'Isiokwu

Chineke Ọ̀ Dị Adị n’Eziokwu?

Chineke Ọ̀ Dị Adị n’Eziokwu?

Ihe Baịbụl kwuru

 Anyị lee anya gburugburu anyị, anyị ga-ahụ ọtụtụ ihe ndị na-egosi na Chineke dị. Baịbụl kwuru, sị: “N’ezie, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Nke bụ́ eziokwu bụ na i chee echiche nke ọma banyere otú ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa si na-arụ ọrụ, otú ihe ndị dị ndụ si malite, ma ọ bụ otú ụbụrụ mmadụ si arụ ọrụ, ị ga-ekweta na o nwere onye kere ihe ndị a, nakwa na onye ahụ karịrị mmadụ.

 Ma ọ bụghị naanị ihe ndị e kere eke ga-eme ka anyị mata banyere Chineke. Baịbụl ga-enyekwara anyị aka. Ọ bụrụ na ị gụọ Baịbụl ma hụ otú amụma ndị e dere na ya si na-emezu, ị ga-ahụ ihe ndị na-egosi na Chineke dị. Ihe ọzọ dị mkpa ị ga-ahụ bụ otú Chineke si mesoo ndị mmadụ ihe, bụ́ nke ga-eme ka ị mata ụdị onye ọ bụ, matakwa na ihe na-emetụ ya n’ahụ́ nakwa na o nwere ike ịhụ mmadụ n’anya ma ọ bụ kpọọ ya asị. (Abụ Ọma 11:5; Jọn 3:16) Baịbụl ga-emekwa ka ị mata na ihe anyị mere nwere ike kpasuo Chineke iwe ma ọ bụ mee ya obi ụtọ.—Abụ Ọma 78:40, 41.