Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Mmadụ Ji Anwụ Anwụ?

Gịnị Mere Mmadụ Ji Anwụ Anwụ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ jụọ ihe mere mmadụ ji anwụ anwụ, nke ka nke ma ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ onye ahụ. Baịbụl sịrị na “ihe ọgbụgba nke na-akpata ọnwụ bụ mmehie.”​—1 Ndị Kọrịnt 15:56.

Gịnị mere mmadụ niile ji eme mmehie ma na-anwụ anwụ?

 Ihe mere Adam na Iv, bụ́ mmadụ abụọ mbụ e nwere n’ụwa, ji nwụọ bụ na ha nupụụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:17-19) Isi ahụ ha nupụụrụ Chineke kpataara ha ọnwụ n’ihi na ọ bụ Chineke bụ “isi iyi nke ndụ.”​—Abụ Ọma 36:9; Jenesis 2:17.

 Adam bufeere ụmụ ya niile mmehie. Baịbụl sịrị na “mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ mmehie mere mmadụ niile ji anwụ anwụ.​—Ndị Rom 3:23.

Otú a ga-esi ewepụ ọnwụ

 Chineke kwere anyị nkwa na oge na-abịa mgbe “ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịzaya 25:8) Otú ọ ga-esi ewepụ ọnwụ bụ na ọ ga-ewepụ ihe na-akpata ọnwụ, ya bụ, mmehie. Chineke ga-esi n’aka Jizọs Kraịst, onye “na-ewepụ mmehie nke ụwa,” mee ya.​—Jọn 1:29; 1 Jọn 1:7.