Aịzaya 25:1-12

  • Ihe ọma dị iche iche ga-emere ndị Chineke (1-12)

    • Jehova ga-akpọ nnukwu oriri a ga-aṅụ mmanya dị mma (6)

    • Ọnwụ agaghịzi adị (8)

25  Jehova, ị bụ Chineke m. Ana m eto gị, na-etokwa aha gị,N’ihi na i meela ihe ndị dị ebube,+Ihe ndị i bu n’obi ime kemgbe oge ochie.+ I meela ihe i kwuru,+ gosikwa na e kwesịrị ịtụkwasị gị obi.   I meela ka otu obodo bụrụ ikpo nkume,Mee ka obodo a rụsiri ike bụrụ ebe e bibiri ebibi,Meekwa ka ụlọ elu ndị mba ọzọ bi gharazie ịdị adị. O nweghị ihe ga-eme ka a rụghachi obodo ahụ.   N’ihi ya, ndị siri ike ga-eto gị. Obodo ndị obi tara mmiri ga-atụ egwu gị.+   N’ihi na ị bụụrụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebe a rụsiri ike,Bụụrụ ogbenye ebe a rụsiri ike n’oge ọ na-ata ahụhụ.+ Ị bụ ebe ha na-agbaba zere nnukwu mmiri ozuzoNa ndò ha na-agbaba zere anwụ.+ Mgbe ndị aka ike wesara ha iwe, ya adị ka mgbe nnukwu mmiri na-ezo n’elu mgbidi, ị na-echebe ha.   Otú ahụ ndò ígwé ojii na-eme kaOkpomọkụ nke dị n’ala kpọrọ nkụ kwụsị,Ka ị na-akwụsị mkpọtụ ndị ala ọzọ na-eme,Na-akwụsịkwa egwú ndị aka ike na-agụ.   N’ugwu a+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emere mmadụ niileNnukwu oriri nke ha ga-eri nri na-edozi ahụ́+Na nnukwu oriri ha ga-aṅụ mmanya dị mma.* Ọ ga-enyekwa ha nri ụmị anụ juru na ya,Nyekwa ha ezigbo mmanya a zara aza.   N’ugwu a ka ọ ga-ebibi* ihe kpuchiri mmadụ niileNa ákwà a kpara akpa nke kpuchiri mba niile.   Ọ ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị* ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri dị n’ihu mmadụ niile.+ Ọ ga-emekwa ka a kwụsị imenye ndị ya ihere n’ụwa niile. Ihe a ga-eme maka na Jehova ekwuola ya.   N’oge ahụ, ha ga na-ekwu, sị: “Onye a bụ Chineke anyị.+ Anyị tụkwasịrị ya obi.+ Ọ ga-azọpụtakwa anyị.+ Onye a bụ Jehova. Anyị tụkwasịrị ya obi. Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọọkwa anyị ụtọ n’ihi na ọ zọpụtala anyị.”+ 10  Jehova ga-echebe ugwu a.+ A ga-azọdakwa Moab ebe ọ dị+Otú e si azọda okporo ọka n’ebe a na-awụfu nsị anụ. 11  Ọ ga-agbatị aka ya tie Moab iheOtú onye na-egwu mmiri si eti aka ya na mmiri. Ọ ga-edozi aka ya tie ya iheOtú ga-eme ka ọ kwụsị ịdị mpako.+ 12  Ọ ga-akwatukwa obodo a rụsiri ike,Ya na mgbidi ndị dị elu e ji gbaa ya ogige. Ọ ga-eme ka ọ daruo ala, nọrọ n’ájá.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mmanya doro edo.”
Na Hibru, “ọ ga-elo.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-elo ọnwụ.”