Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ịmịnye Mmadụ Ọbara n’Ahụ́?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ịmịnye Mmadụ Ọbara n’Ahụ́?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl nyere anyị iwu ka anyị ghara itinye ọbara n’ahụ́ anyị. Ọ bụ ya mere anyị ekwesịghị ịnara ọbara ma ọ bụ ihe anọ bụ́ isi dị n’ọbara, ma ọ̀ dị n’ụdị a na-amịnye amịnye ma ọ̀ dị n’ụdị mkpụrụ ọgwụ ma ọ̀ dị n’ụdị ihe oriri. Lee ihe amaokwu Baịbụl ndị a kwuru:

  •   Jenesis 9:4. Mgbe Iju Mmiri oge Noa gachara, Chineke gwara Noa na ezinụlọ ya na ha nwere ike igbu ụmụ anụmanụ taa anụ ha mana ha erikwala ọbara ha. Chineke gwara Noa, sị: “Ma unu erikọtala anụ na mkpụrụ obi ya—ọbara ya.” Ihe a Chineke gwara Noa gbasakwara mmadụ niile n’ihi na anyị niile si n’ezinụlọ Noa.

  •   Levitikọs 17:14. “Unu erila ọbara nke ụdị anụ ọ bụla, n’ihi na mkpụrụ obi nke ụdị anụ ọ bụla bụ ọbara ya. A ga-ebipụ onye ọ bụla riri ya.” Chineke weere ya na mkpụrụ obi ma ọ bụ ndụ dị n’ime ọbara, na ọ bụkwa yanwa nwe ya. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ naanị mba Izrel ka Chineke nyere iwu a, ma o gosiri na Chineke ejighị iwu gbasara iri ọbara egwu egwu.

  •   Ọrụ Ndịozi 15:20. “Na-ezere . . . ọbara.” Ihe a e kwuru n’Ọrụ Ndịozi gosiri na Chineke nyekwara Ndị Kraịst otu iwu ahụ o nyere Noa. Ihe ndị a kọrọ mere n’oge ochie gosiri na Ndị Kraịst oge mbụ ekweghị eri ọbara, ọ sọgodị ya ya bụrụ na a chọrọ iji ya agwọ ha ọrịa.

Gịnị mere Chineke ji nye anyị iwu ka anyị zere ọbara?

 Mmadụ nwere ike izere ọbara n’ihi na e nwere ọtụtụ nsogbu ọbara a mịnyere mmadụ n’ahụ́ nwere ike ịkpatara ya. Ma, ihe kachanụ mere Chineke ji nye anyị iwu ka anyị zere ọbara bụ na ọbara dị nsọ n’anya ya.—Levitikọs 17:11; Ndị Kọlọsi 1:20.