Ọrụ Ndịozi 15:1-41

  • Okwu e sere n’Antiọk gbasara ibi úgwù (1, 2)

  • A gara Jeruselem ka e kpebie okwu gbasara ibi úgwù (3-5)

  • Ndị okenye na ndịozi zukọrọ (6-21)

  • Akwụkwọ ozi òtù na-achị isi dere (22-29)

  • E ji akwụkwọ ozi gbaa ọgbakọ dị iche iche ume (30-35)

  • Pọl na Banabas gawara iche iche (36-41)

15  E nwere ụmụ nwoke ụfọdụ si Judia bịa Antiọk ma malite ịkụziri ụmụnna, sị: “Ọ bụrụ na e bighị unu úgwù dị ka Iwu Mosis kwuru,+ a gaghị azọpụta unu.”  N’ihi ya, ha na Pọl na Banabas nwere nghọtahie, rụọkwa ezigbo ụka. Ụmụnna meziri ndokwa ka Pọl na Banabas na ụfọdụ ụmụnna ndị ọzọ gakwuru ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem+ gbasara okwu a.  Mgbe ọgbakọ ahụ dupụchara ụmụnna ndị a, Pọl na ndị ya na ha so gara Finishia, gaakwa Sameria, na-akọrọ ha ihe niile gbasara otú ndị mba ọzọ si na-echegharị. Obi bụkwa ụmụnna ahụ niile sọ aṅụrị mgbe ha nụrụ ihe ndị a.  Mgbe ha ruru Jeruselem, ọgbakọ dị ebe ahụ na ndịozi na ndị okenye nabatara ha nke ọma. Pọl na Banabas kọkwaara ha ọtụtụ ihe Chineke si n’aka ha mee.  Ma, ụfọdụ n’ime ndị nọbu n’òtù ndị Farisii, ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, biliri n’oche ha, sị: “E kwesịrị ibi ha úgwù, gwakwa ha ka ha na-edebe Iwu Mosis.”+  Ndịozi na ndị okenye wee zukọta ka ha leba anya n’okwu a.  Ma mgbe ha kwutere okwu a aka, Pita biliri, sị ha: “Ụmụnna m, unu ma nke ọma na Chineke si n’ime anyị niile họrọ m ná mmalite, ka ndị mba ọzọ si n’ọnụ m nụ ozi ọma ma kwere.+  Chineke, onye ma obi mmadụ,+ nyekwara ha mmụọ nsọ+ otú o nyere anyị, iji gosi na ọ nabatala ha.  Otú o si were anyị ka o sikwa were ha,+ n’ihi na o mere ka obi ha dị ọcha maka na ha nwere okwukwe.+ 10  Gịnịzi mere unu ji akpasu Chineke iwe? Unu na-ebokwasị ndị na-eso ụzọ Jizọs ibu+ nna nna anyị hà na anyịnwa na-ebulighị.+ 11  Ma, obi siri anyị ike na a ga-esi n’amara Onyenwe anyị Jizọs+ zọpụta anyị otú ahụ a ga-azọpụta ha.”+ 12  Mgbe o kwuchara ihe a, ebe niile dara jụụ, mmadụ niile nọ ebe ahụ malitekwara ige Banabas na Pọl ntị ka ha na-akọ ọtụtụ ọrụ ebube Chineke si n’aka ha rụọrọ ndị mba ọzọ. 13  Mgbe ha kwuchara, Jems sịrị: “Ụmụnna m, geenụ m ntị. 14  Simiọn*+ akọọrọla anyị nke ọma otú Chineke si cheta ndị mba ọzọ, malitezie isi n’ime ha na-ahọrọ ndị ga-aza aha ya.+ 15  Ihe a o kwuru dabara n’ihe ndị amụma dere. Ha dere, sị: 16  ‘Ihe ndị a mechaa, m ga-alaghachi bulite ụlọikwuu* Devid dara ada. M ga-arụghachikwa ebe niile e bibiri ebibi na ya ma mee ka ha dị otú ha dịbu, 17  ka ndị fọdụrụ wee chọsie mụnwa bụ́ Jehova* ike, ha na ndị mba ọzọ niile, ndị na-aza aha m. Ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova* kwuru ihe ndị a. Ọ bụ m na-eme ha.+ 18  O teela m kpebiri ime ihe ha.’+ 19  N’ihi ya, uche m bụ ka a ghara inye ndị mba ọzọ chọrọ ife Chineke nsogbu.+ 20  Kama ka e degara ha akwụkwọ ka ha jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị,+ ghara ịkwa iko,*+ ghara iri anụ a nyagburu anyagbu,* gharakwa iri ọbara.+ 21  N’ihi na kemgbe oge ochie, e nwere ndị na-ekwusa banyere Mosis n’obodo dị iche iche, n’ihi na e nwere ndị na-agụpụta ihe ndị o dere n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike.”+ 22  Ndịozi na ndị okenye nakwa ndị niile nọ n’ọgbakọ wee kpebie ka ha họpụta ụmụ nwoke abụọ n’ime ha ma ziga ha na Pọl na Banabas Antiọk. Ha wee ziga Judas onye a na-akpọ Basabas nakwa Saịlas,+ ndị na-arụrụ ụmụnna ha ezigbo ọrụ n’ọgbakọ. 23  Ha dere akwụkwọ nye ha. Ihe e dere n’akwụkwọ ahụ bụ: “Ọ bụ ụmụnna unu, ma ndịozi ma ndị okenye, na-edetara ụmụnna ndị nọ n’Antiọk+ na Siria na Silishia, bụ́ ndị mba ọzọ, akwụkwọ ozi a: Anyị na-ekele unu. 24  Anyị anụla na ụfọdụ n’ime anyị bịara na-agwa unu okwu na-enye unu nsogbu,+ na-achọ ime ka unu hapụ ihe unu kweere. N’eziokwu, ọ bụghị anyị gwara ha ihe ahụ ha gwara unu. 25  Anyị ji otu olu kwekọrịta ịhọta ụmụ nwoke abụọ anyị ga-ezitere unu, tinyere ndị anyị hụrụ n’anya, bụ́ Banabas na Pọl, 26  ndị nyere ndụ* ha maka aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 27  N’ihi ya, anyị na-ezite Judas na Saịlas, ka ha wee jiri ọnụ ha kọọkwa otu ihe a dị n’akwụkwọ ozi a.+ 28  Mmụọ nsọ+ enyerela anyị aka ikpebi na a gaghị ebo unu ibu arọ, ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa: 29  ka unu jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị,+ ghara iri ọbara,+ ghara iri anụ a nyagburu anyagbu,*+ gharakwa ịkwa iko.*+ Ọ bụrụ na unu elezie anya jụ ihe ndị a, ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma.” 30  Pọl na ndị ya na ha so aga wee gawa Antiọk. Mgbe ha ruru, ha kpọkọtara ndị na-eso ụzọ Jizọs ma nye ha akwụkwọ ozi ahụ. 31  Mgbe ha gụchara ya, ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi na ọ gbara ha ume. 32  Ebe ọ bụ na Judas na Saịlas bụ ndị amụma, ha gwara ụmụnna ahụ ọtụtụ ihe gbara ha ume, meekwa ka okwukwe ha sie ike.+ 33  Mgbe ha nọtụrụ ebe ahụ, ụmụnna ahụ dupụrụ ha ka ha laa. Ha sịkwara ha: “Lakwurunụ ndị zitere unu n’udo.” 34 * —— 35  Ma, Pọl na Banabas esoghị ha laa. Ha nọ n’Antiọk na-akụzi ihe. Ha na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa na-ekwusa ozi ọma banyere okwu Jehova.* 36  Mgbe ụbọchị ụfọdụ gara, Pọl sịrị Banabas: “Bịa ka anyị gaa leta ụmụnna nọ n’obodo ndị anyị kwusara okwu Jehova,* ka anyị mara otú ha mere.”+ 37  Banabas chọrọ ka ha kpọrọ Jọn, onye a na-akpọkwa Mak, gawa.+ 38  Ma Pọl chere na o kwesịghị isoro ha, ebe ọ bụ na ọ hapụrụ ha na Pamfilia, o soghịkwa ha gaa kwusaa ozi ọma.+ 39  Ha abụọ wee see ezigbo okwu, nke mere na ha kewara. Banabas+ wee kpọrọ Mak, ha abanye ụgbọ mmiri gawa Saịprọs. 40  Ma, Pọl kpọọrọ Saịlas. Mgbe ụmụnna kpechara ekpere ka Jehova* meere Pọl amara,+ ọ gawara ebe ọzọ. 41  Ọ gawara Siria na Silishia, na-eme ka ọgbakọ ndị dị ebe ahụ sie ike n’okwukwe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Pita.
Ma ọ bụ “ụlọ ndò; ụlọ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “anụ a na-egbupụghị ọbara.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “anụ a na-egbupụghị ọbara.”
Gụọ A3.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.