Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịtụ Ụjọ Ọnwụ?

Olee Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịtụ Ụjọ Ọnwụ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ịtụ ụjọ ọnwụ abụghị ihe ọjọọ n’ihi na ọnwụ bụ onye iro anyị, anyị anaghịkwa eji ndụ anyị egwu egwu. (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Ma, ọ bụrụ na ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ kweere emee ka mmadụ na-atụ ọnwụ ụjọ na-enweghị isi, ọ ga-eme ka onye ahụ ‘nọrọ n’ohu ná ndụ ya niile.’ (Ndị Hibru 2:​15) Ịmata ihe bụ́ eziokwu ga-eme ka ị ghara ịna-atụ ọnwụ ụdị ụjọ a, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ ghara ịnụ ụtọ ndụ.​—Jọn 8:​32.

Ihe bụ́ eziokwu gbasara ọnwụ

  •   Ndị nwụrụ anwụ enweghịzi ihe ha ma. (Abụ Ọma 146:4) Baịbụl ji ọnwụ tụnyere ụra. Ọ bụ ya mere i kwesịghị ịtụwa ụjọ na ị ga na-ata ahụhụ ma ọ bụ gaa n’ebe a ga na-emekpa gị ahụ́ ma ị nwụọ.​—Abụ Ọma 13:3; Jọn 11:11-​14.

  •   E nweghị ihe ndị nwụrụ anwụ ga-emeli ndị dị ndụ. Ndị iro anyị na-eme ihe ike nwụọ, o nweghịzi ihe ha ga-emeli anyị. (Aịzaya 26:14) Baịbụl sịrị na “ịkpọasị ha na ekworo ha alaworị n’iyi.”​—Ekliziastis 9:6.

  •   Ma, ọ pụtaghị na onye ọ bụla nwụrụnụ agaghịzi adị ndụ ọzọ. Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.​—Jọn 5:​28, 29; Ọrụ Ndịozi 24:15.

  •   Chineke kwekwara anyị nkwa na oge na-abịa mgbe ‘ọnwụ na-agaghị adị ọzọ.’ (Mkpughe 21:4) Baịbụl kwuru banyere oge ahụ, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi,” ha agakwaghị na-atụ ụjọ na ha ga-anwụ.​—Abụ Ọma 37:29.