Aịzaya 26:1-21

  • Abụ gbasara ịtụkwasị Chineke obi na ịzọpụta ndị mmadụ (1-21)

    • Jaa Jehova bụ Oké Nkume na-adịru mgbe ebighị ebi (4)

    • Ndị bi n’ụwa ga-amụta ime ezi omume (9)

    • “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ” (19)

    • Banyenụ n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime zoo (20)

26  N’oge ahụ, a ga-abụ abụ a+ na Juda:+ “Anyị nwere obodo siri ike.+ Chineke na-azọpụta mmadụ otú mgbidi siri ezigbo ike si echebe obodo.+   Megheenụ ọnụ ụzọ ámá+ ka mba na-eme ezi omume,Nke na-erubekwara Chineke isi, bata.   Ị ga-echebe ndị ji obi ha niile tụkwasị gị obi.* Ị ga-eme ka ha na-ebi n’udo mgbe niile,+N’ihi na ọ bụ gị ka ha tụkwasịrị obi.+   Tụkwasịnụ Jehova obi ruo mgbe ebighị ebi,+N’ihi na Jaa* Jehova bụ Oké Nkume na-adịru mgbe ebighị ebi.+   O wetuola ndị dị mpako ala, ya bụ, obodo na-akpa nganga.* Ọ na-eme ka obodo ahụ daa. Ọ na-eme ka ọ daruo ala. Ọ na-eme ka ọ nọrọ n’ájá.   Ụkwụ ndị nọ n’ahụhụNa ụkwụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ga-azọda ya.”   Onye ezi omume na-aga n’ụzọ kwụ ọtọ.* Ị ga-eme ka ụzọ onye ezi omume dị larịị,N’ihi na ị bụ onye ezi omume.   Jehova, anyị tụkwasịrị gị obiKa anyị na-eso otú i si ekpe ikpe ziri ezi. Anyị ji aha gị kpọrọ ihe, anyị na-echekwa gbasara gị.   Ọ na-agụsi m* agụụ ike n’abalị ịmata gị. N’eziokwu, m ji obi m niile na-achọ gị.+ I kpewe ụwa ikpe,Ndị bi n’ụwa ga-amụta ime ezi omume.+ 10  Ọ bụrụgodị na e meere onye ajọ omume amara,Ọ gaghị amụta ime ezi omume.+ Ya nọrọgodị n’ala ndị ezi omume, ọ ga na-eme ihe ọjọọ.+ Ọ gaghịkwa ahụ na Jehova dị ebube.+ 11  Jehova, i weliri aka gị elu, ma ha anaghị ahụ ya.+ Ihere ga-eme ha ma ha hụ otú i si echebe ndị gị maka na ị hụrụ ha n’anya. Ọkụ gị ga-erepịa ndị iro gị. 12  Jehova, ị ga-eme ka udo dịrị anyị,+N’ihi na ọ bụ gị na-agọziIhe niile anyị na-eme. 13  Jehova bụ́ Chineke anyị, e wezụga gị, ndị ọzọ bụ́ ndị nna ukwu achịala anyị,+Ma, ọ bụ aha naanị gị ka anyị na-eto.+ 14  Ha anwụọla. Ha agaghị adị ndụ. Ha adịghị ndụ, ha agaghịkwa ebili.+ N’ihi na ị chọrọ ilebara ha anya,Laa ha n’iyi, ka a ghara ịnụ aha ha ọzọ. 15  Jehova, i meela ka mba a hikwuo nne. I meela ka mba a hikwuo nne. I meela ihe e ji maka ya na-eto gị.+ I meela ka mba a nwetakwuo ala gbaa gburugburu.+ 16  Jehova, n’oge ha na-ata ahụhụ, ha chọwara gị. Ha kpere ekpere n’olu dị ala mgbe ị dọrọ ha aka ná ntị.+ 17  Jehova, i meela ka ọnọdụ anyị yie ọnọdụ nwaanyị dị ime,Nke oge o ji amụ nwa ruru, ime ana-eme ya,Ya ana-eti mkpu n’ihi otú o si egbu ya mgbu. 18  Anyị bịara dị ime, ime emewe anyị. Ma, ọ dị ka à ga-asị na anyị mụrụ ifufe. Anyị azọpụtaghị ala a. Anyị amụtaghịkwa ndị ga-ebi n’ala a. 19  “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ. Ozu ndị m* ga-ebili.+ Unu ndị bi n’ájá,+Tetanụ tie mkpu ọṅụ,N’ihi na igirigi na-adasa gị dị ka igirigi na-ada n’ụtụtụ,*Ala ga-emekwa ka ndị na-adịghị ndụ dịrị ndụ.* 20  Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime,Mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyechara.+ Zoonụ nwa mgbe nta,Ruo mgbe Chineke wechara iwe.+ 21  Mụnwa bụ́ Jehova si ebe m bi na-abịaIme ka ndị bi n’ala a zaa ajụjụ maka mmehie ha. Ala a ga-emekwa ka a mara ndị e gburu egbu* na ya,Ọ gaghịzi ezochi ndị ya e gburu egbu.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “ndị obi kara ime ihe ha chọrọ ime.”
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Na Hibru, “ndị bi n’ebe dị elu, bụ́ obodo dị elu.”
Ma ọ bụ “n’ụzọ dị larịị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Ozu m.”
O nwere ike ịbụ, “igirigi na-ada n’ahịhịa (malo).”
Ma ọ bụ “ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.”
Na Hibru, “ọbara ndị a wụfuru.”