Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Jeremaya 29:11—​‘M Maara Echiche Niile M Na-eche Banyere Unu’

Jeremaya 29:11—​‘M Maara Echiche Niile M Na-eche Banyere Unu’

 “Jehova a kwuru, sị, ‘Ama m nnọọ ihe m na-echere unu. Ọ bụ ka udo dịrị unu, ọ bụghị ka ọdachi dakwasị unu. M chọrọ ka ihe dịrị unu ná mma n’ọdịnihu nakwa ka unu nwee olileanya.’”​—Jeremaya 29:​11, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “N’ihi na mụ onwe m maara echiche nile m na-eche banyere unu. Ọ bụ echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ihe ọjọọ. Ọ bụ echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, echiche inye unu olileanya kwesịrị ntụkwasị obi.”​—Jeremaya 29:11, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ihe Jeremaya 29:11 Pụtara

 Jehova Chineke kwere ndị na-efe ya nkwa na ọ ga-eme ka ha nwee udo n’ọdịnihu. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị na-efe Chineke n’oge ochie ka e bu n’obi dee ihe dị n’amaokwu a, ma, ihe ndị e kwuru na ya ka bụkwa ihe Chineke bu n’obi maka anyịnwa. Chineke bụ “onye na-eme ka anyị nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:13) O dere ọmarịcha nkwa a na Baịbụl iji “mee ka anyị nwee olileanya” na echi ga-aka mma.​—Ndị Rom 15:4.

Ihe Ndị Gbara Jeremaya 29:11 Gburugburu

 Ihe ndị e dere n’amaokwu a so n’akwụkwọ ozi e zigaara ndị Izrel e si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn. b (Jeremaya 29:1) Chineke gwara ndị ahụ a dọọrọ n’agha na ha ga-anọte aka n’ebe ahụ a dọọrọ ha n’agha nakwa na ha ga-arụ ụlọ, kọọ ubi, nọrọkwa ebe ahụ mụọ ụmụ. (Jeremaya 29:​4-9) Chineke gwakwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu anọzuo afọ iri asaa na Babịlọn, m ga-emere unu ihe ọma, kpọlata unu ebe a [Jeruselem] otú m kwere unu ná nkwa.” (Jeremaya 29:10) Chineke mesiri ha obi ike na ya agaghị echefu ha nakwa na ha ga-alaghachi n’ala ha.​—Jeremaya 31:​16, 17.

 Chineke mezuru nkwa o kwere ndị Izrel. Saịrọs eze Peshia meriri Babịlọn otú Chineke buru n’amụma. (Aịzaya 45:​1, 2; Jeremaya 51:​30-32) Mgbe e mechara, Saịrọs hapụrụ ndị Juu ka ha laghachi n’obodo ha. Ha laghachiri Jeruselem mgbe ha nọzuru afọ iri asaa n’ebe ahụ a dọọrọ ha n’agha.​—2 Ihe E Mere 36:​20-23; Ezra 3:1.

 Chineke mezuuru ndị ya nkwa ahụ dị na Jeremaya 29:11. N’ihi ya, obi siri ndị na-efe Chineke ike taa na ọ ga-emezukwa nkwa ya niile. Otu n’ime nkwa ndị ahụ bụ na udo ga-adị n’ụwa niile mgbe Kraịst Jizọs ga-achịwa ụwa n’Alaeze Chineke.​—Abụ Ọma 37:​10, 11, 29; Aịzaya 55:11; Matiu 6:10.

Ihe Ndị Na-abụghị Eziokwu Gbasara Jeremaya 29:11

 Ụgha: E nwere ihe Chineke bu n’obi kee onye ọ bụla.

 Eziokwu: Chineke na-ahapụ onye ọ bụla ka o jiri aka ya kpebie ihe ọ ga-eji ndụ ya eme. Ọ bụ ndị Izrel niile a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ka Chineke gwara ihe a dị na Jeremaya 29:11. O nwere ihe ọma Chineke buuru ha niile n’obi. Ọ bụ ka udo dịrị ha n’ọdịnihu. (Jeremaya 29:4) Ma, Chineke hapụrụ onye ọ bụla n’ime ha ka o jiri aka ya kpebie ma ọ̀ ga-eso ná ndị a ga-emezuru nkwa ahụ ka ọ̀ bụ na ọ gaghị eso. (Diuterọnọmi 30:​19, 20; Jeremaya 29:32) Ndị chọrọ ka Chineke nyere ha aka ji obi ha niile kpegara ya ekpere.​—Jeremaya 29:​12, 13.

 Ụgha: Otú Chineke ga-esi eme ka ihe gaara ndị na-efe nke ọma bụ inye ha akụnụba.

 Eziokwu: Okwu Hibru a sụgharịrị ‘ihe ịga nke ọma’ n’ụfọdụ Baịbụl na Jeremaya 29:11 pụtara “udo, ahụ́ ike, na ihe ịdịrị mmadụ ná mma.” Ihe ndị gbara amaokwu a gburugburu na-egosi na ihe Chineke kwere nkwa imere ndị Izrel ahụ a dọọrọ n’agha abụghị inye ha akụnụba, kama, ọ bụ ime ka ha nwee udo nakwa ka ihe dịrị ha ná mma. A gaghị ebibi ha kpamkpam. Kama, ha ga-emecha laghachi Jeruselem otu ụbọchị.​—Jeremaya 29:​4-10.

Gụọ Jeremaya isi 29 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.

a Ezigbo aha Chineke bụ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.

b Akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible Commentary kwuru gbasara Jeremaya 29:11, sị: “O siri ike ịhụ ebe ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ ebe Yahweh [Jehova] kwere ndị ahụ a dọọrọ n’agha ụdị ọmarịcha nkwa a gosiri na ọ dị ọmịiko. O mere ka ndị ahụ a dọọrọ n’agha nwee ezigbo olileanya.”​—Mpịakọta nke 7, peeji nke 360.