Ọrụ Ndịozi 5:1-42

  • Ananayas na Safaịra (1-11)

  • Ndịozi nọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube (12-16)

  • A tụrụ ndịozi mkpọrọ, mmụọ ozi akpọpụta ha (17-21a)

  • A kpọtara ndịozi ahụ ọzọ n’ihu ndị Sanhedrin (21b-32)

    • “Anyị ga-erubere Chineke isi karịa mmadụ” (29)

  • Aro Gameliel tụụrụ ndị Sanhedrin (33-40)

  • Ndịozi kwusara ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ (41, 42)

5  Otu nwoke aha ya bụ Ananayas na Safaịra nwunye ya rekwara ala ha.  Ma, o zoro ụfọdụ ego ha retere, wee wetara ndịozi nke fọdụrụ. Nwunye ya makwa ihe a o mere.+  Ma Pita sịrị ya: “Ananayas, gịnị mere i ji kwe ka Setan mee ka obi kaa gị ịghara mmụọ nsọ+ ụgha+ wee zoo ego ụfọdụ unu retere n’ala unu?  Ala ahụ ọ́ bụghị nke gị tupu gị eree ya? Mgbe i rere ya, ọ̀ bụ na ego i retere ya abụghị nke gị? Gịnị mere ime ụdị ihe a ji bata gị n’obi? Ọ bụ Chineke ka ị ghaara ụgha, ọ bụghị mmadụ.”  Mgbe Ananayas nụrụ ihe a, ọ dara n’ala nwụọ. Ezigbo ụjọ wee jide ndị niile nụrụ ya.  Ụmụ okorobịa wee bilie, fụchie ya ákwà, buru ya gaa lie.  Ma mgbe ihe dị ka awa atọ gachara, nwunye ya batara. Ọ maghịkwa ihe merenụ.  Pita sịrị ya: “Gwa m, ọ̀ bụ ego ole a ka unu abụọ rere ala ahụ?” Ya asị: “Ee, ọ bụ ego ole a.”  Pita wee sị ya: “Gịnị mere unu abụọ ji kwekọrịta ịghọ mmụọ Jehova* aghụghọ? Ị̀ na-anụ ụda ụkwụ ndị mmadụ n’èzí? Ọ bụ ụda ụkwụ ndị gara lie di gị. Ha ga-eburukwa gị pụọ.” 10  Ozugbo ahụ, ọ dara n’ụkwụ Pita nwụọ. Mgbe ụmụ okorobịa ahụ batara, ha hụrụ na ọ nwụọla, ha wee buru ya gaa lie n’akụkụ di ya. 11  N’ihi ya, ezigbo ụjọ jidere ọgbakọ ahụ niile na ndị niile nụrụ ihe a merenụ. 12  Ndịozi nọkwa na-arụrụ ọtụtụ ndị ọrụ ebube.+ Ha niile na-ezukọkwa na Varanda Solomọn.+ 13  N’eziokwu, e nweghị otu onye n’ime ndị ọzọ ụjọ kwere soro ha. Ma, ndị mmadụ ka na-aja ha mma. 14  Ọtụtụ ndị nọkwa na-ekwere n’Onyenwe anyị, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.+ 15  Ha kpọpụtadịrị ndị ọrịa n’okporo ámá ma nyiwe ha n’obere àkwà* na n’ute dị iche iche, ka ọ ga-abụ, Pita gafewe, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, onyinyo ya esi n’elu ụfọdụ n’ime ha gafee.+ 16  Ìgwè mmadụ ndị sikwa n’obodo ndị dị Jeruselem nso nọ na-abịa, na-ebute ndị ọrịa na ndị mmụọ ọjọọ* na-enye nsogbu. A na-agwọkwa ha niile. 17  Ma nnukwu onye nchụàjà biliri, ya na ndị niile ya na ha nọ, ndị so n’òtù ndị Sadusii, iwe jukwara ha obi. 18  Ha wee jide ndịozi ahụ ma kpọchie ha n’ụlọ mkpọrọ.+ 19  Ma n’abalị, mmụọ ozi Jehova* meghere ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ,+ kpọpụta ha ma sị: 20  “Gaanụ n’ụlọ nsọ, na-agwakwanụ ndị mmadụ gbasara ndụ a ga-adị n’ọdịnihu.” 21  Mgbe ha nụrụ ihe a, ha banyere n’ụlọ nsọ mgbe chi bọrọ ma malite ịkụziri ndị mmadụ ihe. Ma, nnukwu onye nchụàjà na ndị so ya bịara kpọkọọ ndị Sanhedrin* nakwa ìgwè ndị okenye ndị Izrel, ziekwa ozi ka a gaa n’ụlọ mkpọrọ kpọtara ha ndịozi ahụ. 22  Ma mgbe ndị nche ahụ rutere n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ha ahụghị ha. N’ihi ya, ha laghachiri gwa ha, 23  sị: “Anyị hụrụ na a kpọchisiri ụlọ mkpọrọ ahụ ike, hụkwa ndị nche ka ha guzo n’ọnụ ụzọ. Ma mgbe anyị meghere ụzọ, anyị ahụghị onye ọ bụla n’ime ya.” 24  Mgbe onyeisi ndị nche ụlọ nsọ na ndị isi nchụàjà nụrụ ihe a, ha nọ na-eche ihe ihe a merenụ ga-akpata. 25  Ma otu onye bịara gwa ha, sị: “Ndị unu tụbara n’ụlọ mkpọrọ nọ n’ụlọ nsọ na-akụziri ndị mmadụ ihe.” 26  Onyeisi ndị nche ụlọ nsọ ahụ na ndị ọrụ ya gara kpọta ha, ma ha amanyeghị ha amanye, n’ihi na ha na-atụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.+ 27  Ha kpọtara ha, ha eguzoro n’ihu ndị zukọrọ na Sanhedrin. Nnukwu onye nchụàjà wee gwa ha, 28  sị: “Anyị gwasiri unu ike ka unu kwụsị ịkụziri ndị mmadụ ihe n’aha a.+ Ma unu emeela ka ihe unu na-akụzi gbasaa ebe niile na Jeruselem. Unu chọkwara ka ọbara nwoke a dị anyị n’isi.”+ 29  Pita na ndịozi ndị ọzọ wee sị: “Anyị ga-erubere Chineke isi* karịa mmadụ.+ 30  Chineke nna nna anyị hà kpọlitere Jizọs, onye unu kwụwara n’elu osisi, ya anwụọ.+ 31  Chineke buliri onye a elu ka ọ nọrọ n’aka nri ya.+ Ọ họpụtara ya ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Ndú+ na Onye Nzọpụta.+ Chineke mere ihe a ka ndị Izrel chegharịa, ka a gbagharakwa ha mmehie ha.+ 32  Anyị ji anya anyị hụ ihe ndị a.+ Mmụọ nsọ,+ nke Chineke na-enye ndị na-erubere ya isi, enyekwarala anyị aka ịgba àmà banyere ihe ndị a.” 33  Mgbe ha nụrụ ihe a, ezigbo iwe were ha,* ha achọwa igbu ha. 34  Ma otu onye Farisii aha ya bụ Gameliel+ biliri ka ọ gwa ndị Sanhedrin* okwu. Ọ bụ onye na-akụzi Iwu,* ndị Juu niile na-asọpụkwara ya. O kwuru ka a kpọpụtụ ndịozi ahụ n’èzí. 35  Ọ gwaziri ha, sị: “Ndị Izrel, cheenụ ihe a nke ọma tupu unu emee ndị a ihe ọ bụla. 36  Dị ka ihe atụ, e nwere oge Tiudas bidoro ikwu na e nwere ihe ya bụ. Ihe dị ka narị ụmụ nwoke anọ (400) ghọkwara ndị òtù ya. Ma e gburu ya, ndị niile na-eso ụzọ ya agbasasịa, òtù ahụ ọ malitere adaakwa. 37  Mgbe nke ya gachara, Judas onye Galili pụtara n’oge a na-edeba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ, o nwetakwara ndị sooro ya. Ma ọ nwụkwara, ndị niile nọ na-eso ya agbasasịa. 38  Ka ihe si kwụrụ ugbu a, ana m asị unu, unu akpala ndị a aka, kama hapụnụ ha. Ọ bụrụ na atụmatụ ha ma ọ bụ ihe a ha na-eme si n’aka mmadụ, ọ ga-akụ afọ n’ala. 39  Ma ọ bụrụ na o si n’aka Chineke, unu agaghị akwụsịli ha.+ Kpacharanụ anya, n’ihi na o nwedịrị ike ịbụ na unu na-alụso Chineke ọgụ.”+ 40  Ha nabatara ihe a o kwuru, kpọọ ndịozi ahụ, pịa* ha ihe,+ gwa ha ka ha kwụsị ikwu okwu n’aha Jizọs, hapụkwa ha ka ha laa. 41  Ha wee si ebe ahụ ndị Sanhedrin* nọ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ+ maka na Chineke gụrụ ha ná ndị e kwesịrị imenye ihere n’ihi aha Jizọs. 42  N’ụbọchị ọ bụla, ma n’ụlọ nsọ ma n’ụlọ n’ụlọ,+ ha na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma gbasara Jizọs, onye bụ́ Kraịst.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ga-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị.”
Ma ọ bụ “ọ dụrụ ha adụ n’obi.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “kụọ.”