Job 37:1-24

  • Ihe ndị Chineke kere na-egosi na ọ dị ukwuu (1-24)

    • Chineke nwere ike ịkwụsị ọrụ mmadụ na-arụ (7)

    • “Chebara ọrụ dị ebube Chineke na-arụ echiche” (14)

    • Ndị mmadụ enweghị ike ịghọta ihe niile banyere Chineke (23)

    • Mmadụ ọ bụla ekwesịghị iche na ya ma ihe (24)

37  “Obi kụwara m kpum kpum,Obi mapụkwara m.   Geenụ ntị nke ọma ka unu nụ mkpọtụ olu ya na-emeNa ụda si n’ọnụ ya apụta nke na-ada ka égbè eluigwe.   Ọ na-eme ka a nụ ya n’okpuru eluigwe niile,Na-emekwa ka àmụ̀mà ya+ gbuo n’ebe niile n’ụwa.   O gbuchaa, a na-anụ oké ụda. Olu ya na-ada ụda ka égbè eluigwe,+Ọ naghịkwa ejichi àmụ̀mà mgbe olu ya na-ada ụda.   Otú olu Chineke si ada ụda+ dị ebube. Ọ na-eme nnukwu ihe ndị anyị na-enweghị ike ịghọta.+   N’ihi na ọ na-asị snoo, ‘Daa n’ụwa,’+Ọ na-asịkwa nnukwu mmiri ozuzo, ‘Zosie ike.’+   Chineke na-akwụsị ọrụ niile mmadụ na-arụ,Ka mmadụ efu ọ bụla wee mata ọrụ ya.   Anụ ọhịa na-abanye n’ebe ha bi,Ha anaghịkwa apụta n’ebe ha na-ezo.   Ifufe mmiri na-esi n’ụlọ ya fere pụta,+Oyi na-esikwa n’ifufe si n’ebe ugwu abịa.+ 10  Ume Chineke kupụrụ na-eme ka mmiri kpụkọọ,+Meekwa ka mmiri niile kpụkọta ọnụ.+ 11  N’eziokwu, ọ na-eme ka mmiri na-anyịgbu urukpuru. Ọ na-eme ka àmụ̀mà ya+ gbuo n’ebe niile n’ígwé ojii. 12  Ha na-aga okirikiri n’ebe ọ na-agwa ha ka ha gaa. Ha na-eme ihe ọ bụla o nyere iwu+ ka ha mee n’ụwa. 13  Ọ na-eji urukpuru eweta ahụhụ,+ jiri ya na-eme ka mmiri zoo n’ala,Ma ọ bụ jiri ya gosi ịhụnanya ya.+ 14  Job, gee ntị n’ihe a. Cheregodị ka i chee echiche nke ọma banyere ọrụ ndị dị ebube Chineke na-arụ.+ 15  Ị̀ ma otú Chineke si achị ígwé ojii,*Nakwa otú o si eme ka àmụ̀mà gbuo n’ígwé ojii ya? 16  Ị̀ ma otú ígwé ojii si erugharị?+ Ihe ndị a bụ ọrụ ndị dị ebube Onye ma ihe niile na-arụ.+ 17  Gịnị mere uwe gị ji ekporo ọkụMgbe ụwa dara jụụ n’ihi ifufe si n’ebe ndịda na-abịa?+ 18  Ì nwere ike iso ya gbasaa mbara igwe,+Ya esie ike ka enyo e ji ọla kọpa* mee? 19  Gwa anyị ihe anyị ga-agwa ya. Anyị enweghị ike ịsa ya ihe ọ bụla n’ihi na anyị nọ n’ọchịchịrị. 20  M̀ kwesịrị ịgwa Chineke na m chọrọ ịgwa ya okwu? Ka è nweela onye kwuru ihe e kwesịrị ịgwa ya?+ 21  Ha enweghịdị ike ịhụ ìhè,*N’agbanyeghị na ọ na-achasi ike na mbara igwe,Ruo mgbe ifufe fere wee mee ka mbara igwe gbachapụ. 22  Ìhè nke na-enwu ka ọlaedo na-esi n’ebe ugwu abịa. Ebube Chineke+ dị egwu. 23  Anyị enweghị ike ịghọta ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ike ya dị ukwuu,+E nweghịkwa mgbe ọ na-anaghị ekpe ikpe ziri ezi+ ma ọ bụ mgbe ọ na-anaghị eme ihe dị mma.+ 24  Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji kwesị ịtụ egwu ya.+ N’ihi na ọ naghị enwe mmasị n’ebe ndị chere na ha ma ihe nọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “si enye ígwé ojii iwu.”
Ma ọ bụ “enyo e ji ígwè kpụọ.” Ọ bụ ígwè, ọla nchara ma ọ bụ ọla kọpa ka e ji eme enyo n’oge ochie. E mechakwara na-eji gbamgbam, ọlaọcha, nakwa ọlaedo eme ya.
Ya bụ, anyanwụ.