Job 38:1-41

  • Jehova gosiri na mmadụ erughị ihe ọ bụla (1-41)

    • ‘Ebee ka ị nọ mgbe e kere ụwa?’ (4-6)

    • Ụmụ Chineke tiri mkpu otuto (7)

    • Ajụjụ ndị a jụrụ Job gbasara ihe ndị e kere eke (8-32)

    • “Iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe” (33)

38  Jehova wee si n’oké ifufe gwa Job,+ sị:   “Ònye bụ onye a nke na-agba otú m si eme ihe ụkwụMa na-ekwu okwu n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ma?+   Biko, jikere ka dimkpa. M ga-ajụ gị ajụjụ, ị ga-azakwa m.   Olee ebe ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?+ Gwa m, ma ọ bụrụ na i chere na ị na-aghọta ihe.   Ònye kpebiri otú ọ ga-aha, ma ọ bụrụ na ị ma? Ma ọ bụ, ònye ji eriri e ji atụ̀ ihe tụọ ya?   Na gịnị ka e gwunyere ntọala ya,Ma ọ bụ, ònye dọnyere nkume ji ya,+   Mgbe kpakpando ụtụtụ+ tikọrọ mkpu ọṅụ ọnụ,Ụmụ Chineke* niile+ amalitekwa iti mkpu otuto?   Ònye mechibidoro oké osimiri ụzọ+Mgbe o si n’ebe o si asọpụta* sọpụtasiwe ike,   Mgbe m yiwere ya ígwé ojii ka uwe,Jirikwa oké ọchịchịrị kee ya ka ákwà, 10  Mgbe m kpaara ya ókè,Tinyekwa ihe e ji atụchi ya nakwa ibo ụzọ ya,+ 11  M wee sị, ‘Ebe a ka ị ga-erute. Ị gaghị agafe ya. Ebe a ka ebili mmiri gị nke na-amali elu ga-ejedebe’?+ 12  È nweela mgbe i nyere anyanwụ ụtụtụ iwu ka ọ waaMa ọ bụ mee ka chi mara ebe ọ ga-abọ,+ 13  Ka ọ bọọ n’ebe niile ụwa sọtụrụNakwa ka ọ yọgharịa ụwa, yọpụ ndị ajọ omume?+ 14  Ọ na-agbanwe otú ụwa dị otú ahụ ihu ụrọ si agbanwe ma e bie ihe e ji aka ihe akara na ya,Ihe ndị dị n’ụwa apụtazie ìhè otú ihe e sere n’ákwà si apụta ìhè. 15  Ma a na-eme ka ìhè kwụsị inwuru ndị ajọ omume,Meekwa ka ndị ajọ omume kwụsị imegbu ndị mmadụ.* 16  Ị̀ gatụla n’ebe oké osimiri si asọpụtaMa ọ bụ gagharịa n’ime mmiri miri emi ka ị chọpụta ihe ndị dị na ya?+ 17  È gosila gị ọnụ ụzọ ọnwụ?+ Ka ị̀ hụtụla ọnụ ụzọ oké ọchịchịrị?+ 18  Ị̀ ghọtala otú ụwa si buo ibu?+ Gwa m, ma ọ bụrụ na ị ma ihe a niile. 19  Olee ebe ìhè bi?+ Oleekwa ebe bụ́ ụlọ ọchịchịrị, 20  Ka i wee kpọrọ ya gaa n’ebe ahụ,Ma ghọta ụzọ e si aga n’ụlọ ya? 21  Ị̀ ma ihe a maka na a mụọla gị mgbe ahụNakwa maka na ị dịteela ndụ aka? 22  Ị̀ banyetụla n’ebe snoo si apụta?+ Ka ị̀ hụtụla ebe akụ́ mmiri ígwé si apụta,+ 23  Bụ́ ihe ndị m dowere maka oge ahụhụ,Maka ụbọchị ọgụ na agha?+ 24  Olee ebe e si ekesa ìhè?* Oleekwa ebe ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ si eku n’ụwa?+ 25  Ònye waara idei mmiri ụzọ,Waakwara égbè eluigwe na ígwé ojii nke mmiri rujuru ụzọ,+ 26  Ka mmiri zoo n’ebe mmadụ na-ebighị,N’ala ịkpa mmadụ ọ bụla na-ebighị,+ 27  Ka mmiri ju n’ala kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị,Meekwa ka ahịhịa pulite na ya?+ 28  Mmiri ozuzo ò nwere nna,+Ma ọ bụ, ònye bụ nna igirigi?+ 29  Ònye na-eme ka mmiri kpụkọọ akpụkọọ? Ònyekwa na-amụpụta mkpụrụ mmiri ígwé?+ 30  Ònye na-ekpuchi mmiri ka à ga-asị na e ji nkume kpuchie ya,Meekwa ka mmiri miri emi kpụkọọ?+ 31  Ì nwere ike ikechi ụdọ ndị ji ìgwè kpakpando Kaịma*Ma ọ bụ tọọ ụdọ ndị ji ìgwè kpakpando Kisịl?*+ 32  Ì nwere ike iduru otu ìgwè kpakpando* pụta n’oge yaMa ọ bụ duzie ìgwè kpakpando Ash* na ụmụ ya? 33  Ị̀ ma iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe,+Ka ì nwere ike ime ka iwu ndị ahụ chịwa ụwa? 34  Ì nwere ike iti mkpu gwa ígwé ojii okwuKa nnukwu mmiri wee zoo dee gị ahụ́?+ 35  Ì nwere ike ime ka àmụ̀mà gbuo? Hà ga-abịa sị gị, ‘Lee anyị’? 36  Ònye mere ka ígwé ojii* mara ihe+Ma ọ bụ mee ka ihe ndị dị na mbara igwe* na-aghọta ihe?+ 37  Ònye ma ihe nke na ọ ga-agụli ígwé ojii ọnụ? Ma ọ bụ, ònye nwere ike ikpu ite mmiri ndị dị n’eluigwe ihu?+ 38  Ònye na-eme ka uzuzu kpụkọọ ọnụ,Ájá ụrọ anyakọtakwa ọnụ? 39  Ì nwere ike igbutere ọdụm anụ ọ ga-eri Ma ọ bụ nyejuo ụmụ ọdụm agụụ ji afọ+ 40  Mgbe ha makpu n’ebe ha na-ezoMa ọ bụ mgbe ha makpu n’ebe ha bi na-eche anụ? 41  Ònye na-akwadebere ugoloọma nri+Mgbe ụmụ ya na-ebe ákwá ka Chineke nyere ha aka,Ha ana-adagharịkwa maka na ihe ha ga-eri adịghị?

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe a bụ akpaala okwu Hibru nke pụtara ndị mmụọ ozi.
Na Hibru, “n’akpa nwa.”
Na Hibru, “Gbajiekwa aka ha weliri elu.”
O nwere ike ịbụ, “ebe àmụ̀mà si egbu.”
O nwere ike ịbụ kpakpando Pledis ndị dị n’ìgwè kpakpando a na-akpọ Tọrọs.
O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Ọrayọn.
Na Hibru, “Mazarọt.”
O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Nnukwu Anụ Bea (Ọsa Mejọ).
O nwere ike ịbụ, “mmadụ.”
O nwere ike ịbụ, “mee ka uche.”