Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU TETA! A

Ebe Pụrụ Iche n’Ịntanet

Ebe Pụrụ Iche n’Ịntanet
  • GỤỌ Baịbụl n’iri asụsụ ise, gụọkwa akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ ise.

  • LEE fim ndị ogbi n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri asụsụ asaa ndị ogbi na-asụ.

  • CHỌỌ ihe n’ọtụtụ asụsụ.

  • GEE ihe nkiri ndị si na Baịbụl.

  • LEE ihe e sere ese e ji akọwa akụkọ ndị dị na Baịbụl.

  • LEE ihe nkiri na fim ndị ga-enyere gị aka idi nsogbu.

  • DANLODUO akwụkwọ, magazin, na ihe ndị a na-egere egere n’akwụghị ụgwọ.

  • Jiri Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET MEE NCHỌNCHỌ. Ị ga-enweta ihe ị na-achọ n’ihe karịrị narị asụsụ.

 MAKA NDỊ DI NA NWUNYE

“M chọrọ ka mụ na nwunye m na-ebi n’udo. Anyị na-esekarị okwu. Ihe bịakwara ka njọ mgbe anyị mụtara ụmụ. Anyị chọrọ ihe ga-enyere anyị aka ịna-ebi n’udo”

BAỊBỤL SỊRỊ:

“A ga-eji amamihe wulite ezinụlọ, a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike.”—Ilu 24:3.

IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

Ị gaa n’ebe a na-akpọ “Ndị Di na Nwunye na Ndị Nne na Nna,” ị ga-ahụ ọtụtụ ihe ga-enyere gị aka. Dị ka:

  • Ịlafere afọ mbụ nke alụmdi na nwunye

  • Gị na ndị ọgọ gị ma ọ bụ nne na nna di gị imekọ ihe

  • Ịdọ ụmụaka aka ná ntị

  • Otú di na nwunye ga-esi kwụsị ịna-esekarị okwu

  • Otú unu ga-esi kwụọ ụgwọ unu ji

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere NDỊ DI NA NWUNYE NA NDỊ NNE NA NNA)

N’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, e nwere ọtụtụ isiokwu ga-abara di na nwunye uru. Ihe ụfọdụ a tụlere na ya bụ otú mmadụ ga-esi kwadebe maka alụmdi na nwunye na otú ndị lụrụ di na nwunye ga-esi elekọta nne na nna ha ndị merela agadi.

(Akwụkwọ a dịkwa n’adres Ịntanet anyị, ya bụ, www.mt711.com/ig. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ)

 MAKA NDỊ NNE NA NNA

“Ahụrụ m ụmụ m n’anya. Achọrọ m ka ha bụrụ ndị m ga-eji na-eme ọnụ ma ha too”

BAỊBỤL SỊRỊ:

“Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.”—Ilu 22:6.

IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

Ị gaa n’ebe e dere “Ụmụaka,” ị ga-ahụ ma fim ma ihe ndị e sere ese ma ihe ndị ọzọ ị ga-eji kụziere ụmụ gị ka ha . . .

  • na-erube isi

  • bụrụ ndị obiọma

  • na ụmụaka ibe ha na-adị ná mma

  • mụta otú ha ga-si na-ekele onye meere ha ihe ọma

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere ỤMỤAKA)

N’akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible nakwa akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site nAka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, e sere ihe ndị ga-enyere gị aka ịkụziri ụmụ gị ihe dị na Baịbụl.

(Akwụkwọ abụọ ahụ dịkwa n’adres Ịntanet anyị, ya bụ, www.mt711.com/ig. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ)

 MAKA NDỊ NA-ETO ETO

“M ga-achọ aro ndị ga-enyere m aka ịna-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ nakwa ịna-erubere mama m na papa m isi. M chọkwara ịma otú m ga-esi mete ezigbo ndị enyi. Abụghịzi m nwata a ga na-agwa ihe ọ bụla ọ ga-eme”

BAỊBỤL SỊRỊ:

‘Ka obi na-atọ gị ụtọ n’oge ị bụ okorobịa.’—Ekliziastis 11:9.

IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

N’ebe e dere “Ndị Na-eto Eto,” e nwere fim na ọtụtụ isiokwu ndị ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na . . .

  • owu na-ama gị

  • o nwere ihe na-enye gị nsogbu n’ụlọ akwụkwọ

  • i meela ihe a sị gị emela n’ụlọ unu

  • o nwere ndị na-achọ gị okwu ma ọ bụkwanụ na a na-egwusa gị egwuregwu iberiibe

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere NDỊ NA-ETO ETO)

Akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè nke mbụ na nke abụọ zara iri ajụjụ asaa na asaa dị mkpa ndị na-eto eto na-ajụkarị.

(Akwụkwọ abụọ ahụ dịkwa n’adres Ịntanet anyị, ya bụ, www.mt711.com/ig. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ)

 MAKA NDỊ CHỌRỌ ỊMA IHE BAỊBỤL NA-EKWU

“M chọrọ ịma ihe Baịbụl na-ekwu. Ebee ka m ga-ebido?”

BAỊBỤL SỊRỊ:

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe.” —2 Timoti 3:16.

IHE NDỊ GA-ABARA GỊ URU

E dere Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ otú ọ ga-adịrị onye ọ bụla mfe ọgụgụ.

(Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere BAỊBỤL)

A zara ọtụtụ ajụjụ n’ebe e dere “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” Ụfọdụ n’ime ha bụ “Ọ̀ bụ Chineke na-akpata nsogbu ụwa?” “Jizọs ọ̀ bụ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile?”

(Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA)

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na mmadụ mụwa Baịbụl n’anaghị gị ego, gaa n’ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl” ka ị hụ ihe ị ga-eme.

(Gaa n’isimbido pịa ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl”)

Otu nwaanyị aha ya bụ Christina kwuru, sị: “M kwụsịrị ịgụ Baịbụl maka na anaghị m aghọta ya. Ma, mgbe m malitere ịmụ akwụkwọ bụ́ ‘Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?’ m bịara ghọtawa ihe Baịbụl na-ekwu.”

Kwa ụbọchị, ihe dị ka narị puku mmadụ asaa na-aga n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ jw.org. Gbalịa na-aga ebe ahụ.