Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE BAỊBỤL KWURU

Otú E Si Kee Ihe

Otú E Si Kee Ihe

Ọ̀ bụ ụbọchị isii nkịtị ka Chineke ji kee ihe?

“Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.”—Jenesis 1:1.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke kere eluigwe na ụwa ọtụtụ afọ gara aga. Na Jenesis 1:1, Baịbụl kwuru na ọ bụ “ná mmalite.” Ndị ọkà mmụta sayensị kwetakwara na eluigwe na ụwa nwere mmalite. Otu ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya gosiri na eluigwe na ụwa anọruola ihe dị ka ijeri afọ iri na anọ.

Baịbụl kwukwara na Chineke ji “ụbọchị” isii kee ihe. Ma, o kwughị na ọ bụ ụbọchị isii nkịtị. (Jenesis 1:31) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe Baịbụl kpọrọ “otu ụbọchị” nwere ike ịbụ ọtụtụ ụbọchị, ọtụtụ ọnwa ma ọ bụkwanụ ọtụtụ afọ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kpọrọ oge niile ahụ Chineke ji kee ihe “ụbọchị Jehova bụ́ Chineke mere ụwa na eluigwe.” (Jenesis 2:4) O doro anya na ọ ga-abụ na ‘ụbọchị’ ahụ Chineke ji kee ihe bụ ọtụtụ puku afọ.—Abụ Ọma 90:4.

IHE MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI CHEBARA YA ECHICHE

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ụbọchị isii nkịtị ka e ji kee ụwa. Ihe ahụ ha na-ekwu nwere ike ime ka mmadụ ghara ikweta ihe Baịbụl kwuru. Ma ọ bụrụ na ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke si kee ihe bụ eziokwu, ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-abara gị uru.—Ilu 3:21.

 Chineke ò bu ụzọ kee ihe ndị na-adịghị ndụ ha emechaa ghọwazie ihe dị ndụ?

“Chineke wee sị: ‘Ka ala wepụta mkpụrụ obi dị ndụ n’ụdị ha dị iche iche.’”—Jenesis 1:24.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke ebughị ụzọ kee ihe ndị dị ndụ dị obere, hapụzie ha ka ha jiri aka ha ghọwa ihe ndị ọzọ buru ibu. Kama, o kere osisi dị iche iche na ụmụ anụmanụ dị iche iche. Osisi ndị ahụ na-amị mkpụrụ ha, ọ bụghị mkpụrụ osisi ọzọ. Ụmụ anụmanụ ndị ahụ ana-amụkwa ụmụ nke ha. (Jenesis 1:11, 21, 24) Ọ bụ otú ha si amụ ụmụ ha mere ụdị anụmanụ ndị ahụ Chineke kere na mbụ ji ju ebe niile n’ụwa.—Abụ Ọma 89:11.

Baịbụl ekwughị ụdị ole e nwere ike inwe n’otu anụmanụ. Dị ka ihe atụ, e nwere ewu Igbo, nwee ewu Awụsa. Ọ bụrụ na mkpi Awụsa agbaa ewu Igbo, nwa ọ ga-amụ agaghị abụ ewu Awụsa ma ọ bụkwanụ ewu Igbo. Ọ ga-abụ ụdị ewu ọzọ. Ụfọdụ ndị na-akpọ ụdị ihe a evolushọn. Ma, ị manụ na ọ bụ ụdị ewu ọzọ ka ewu ahụ mụtara, ọ bụghị nkịta. Ndị ọkà mmụta sayensị kwukwara na e nweghị ụdị osisi ma ọ bụ anụmanụ ọ bụla nọkatara dịwa ndụ ma e wepụ ndị ahụ Chineke kere kemgbe ụwa.

IHE MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI CHEBARA YA ECHICHE

Baịbụl kwuru na Chineke kere anụmanụ ka ha na-amụ ụdị ha. Sayensị kwadoro ihe a Baịbụl kwuru. Ebe ọ bụ na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu, ihe ndị ọzọ o kwuru, dị ka akụkọ ndị mmadụ na amụma bụkwa eziokwu.

Ebee ka Chineke si nweta ihe ndị o ji kee eluigwe na ụwa?

“Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe.”—Aịzaya 45:12, “Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.”

IHE BAỊBỤL KWURU

Ike Chineke enweghị atụ. (Job 37:23) Ndị ọkà mmụta chọpụtakwara na o nweghị ihe ọ bụla ga-adị ma ọ bụrụ na e jighị ike mee ya. Ihe a ha kwuru bụ eziokwu. Baịbụl kwukwara na Chineke nwere ike dị ukwuu, ọ bụkwa ike ahụ ka o ji kee eluigwe na ụwa. (Aịzaya 40:26) Chineke kwere nkwa na ya ga-eji ike ya na-elekọta ihe niile o kere. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na Chineke na-eme ka anyanwụ, ọnwa na kpakpando dịruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 148:3-6.

IHE MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI CHEBARA YA ECHICHE

Otu ọkà mmụta kwuru na sayensị agaghị akọwali otú eluigwe na ụwa si malite ịdị na ihe mere e ji kee ha. Ma, Baịbụl kwuru otú Chineke si kee eluigwe na ụwa nakwa ihe mere o ji kee ụwa. Ọ gwakwara anyị ihe mere Chineke ji kee ụmụ mmadụ. *

^ para. 16 Ị chọọ ịgụkwu banyere ihe e kwuru ebe a, gụọ isi nke atọ n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova biri ya. Ị gaa n’adres Ịntanet anyị, ị ga-ahụ ya.