Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 È KERE YA EKE?

Ahụ́ Agwọ

Ahụ́ Agwọ

AGWỌ enweghị aka nke o ji enwe ụkwụ. Ụfọdụ na-arị elu osisi akpụ jụrụ ahụ́, ebe ụfọdụ na-egwu ọnụ n’ala biri. N’ihi ya, ahụ́ agwọ na-esi ezigbo ike ka o nwee ike ịna-aga ebe ọ bụla ọ chọrọ. Gịnị mere ahụ́ agwọ ji esi ike otú ahụ?

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: E nwere ụdị agwọ dị iche iche. Otú ahụ ha si dị iche iche ka ahụ́ ha si dịkwa iche iche. Ahụ́ ụfọdụ na-esi ezigbo ike karịa nke ndị ọzọ. Ma, e nwere ebe ahụ́ ha nọ yie ibe ha. Ebe elu ya siri ike ma ebe ime ya esighị ike. Otú a ahụ́ agwọ dị ò nwere uru ọ bara? Ee. Otu onye ọkachamara kwuru na ihe ọ bụla elu ya siri ike ma ime ya adị nro na-esi ajọ ike. Otú ahụ ahụ́ agwọ dị na-eme ka ọ dịrị ya mfe ịna-akpụ n’ala, na-emekwa ka ọ na-aga n’ebe bụ okwute okwute n’emerụghị ahụ́. Ebe ọ bụ n’ihe dị ka ọnwa abụọ ma ọ bụ ọnwa atọ ka agwọ ji ewe iwere, ahụ́ ya kwesịrị nnọọ isi ike.

Ndị ọkachamara ekwuola na e nwere ike iji ụdị ihe dị n’ahụ́ agwọ rụta ihe na-agaghị emebi ngwa ngwa nke ndị dọkịta nwere ike iji na-agwọ ndị ọrịa. E nwekwara ike iji ya rụta ihe na-akpụ akpụ a ga-eji na-ebu ibu nke a na-agaghị na-atụ mmanụ mgbe mgbe.

Gịnị ka i chere? Ì chere na ahụ́ agwọ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya?