Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU TETA! A

Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?

Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?

E NWERE otu nwa agbọghọ aha ya bụ Akụnne. * Isi na-aghọ ya nkọ, ihu na-abụkwa ya ọchị ọchị. Ọ na-achọkwa ka ya na ndị mmadụ na-anọrị. Ma, obi ya na-agwa ya na ọ baghị uru. Obi na-ajọkwa ya njọ ruo ọtụtụ ọnwa. O kwuru, sị: “Kwa ụbọchị, m na-eche otú m ga-esi nwụọ. Ama m na m nwụọ, e nweghị onye ga-eso m nwụọ.”

Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebi na Kanada kwuru na mgbe ọ bụla mmadụ gburu onwe ya n’obodo ahụ, e nweelarị narị mmadụ abụọ nwara igbu onwe ha, nweekwa narị mmadụ anọ ọzọ igbu onwe ha gbatarala n’obi.

Akụnne kwuru na e nweghị ihe ga-eme ka ya gbuo onwe ya. Ma mgbe ụfọdụ, ọ na-eche na ndụ ọ dị abaghị uru. O kwuru na ihe ọ chọrọ bụ ka ụgbọala gbuo ya nakwa na ọ kaara ya mma ịnwụ.

Otú a ọ dị Akụnne ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị taa. E nwekwaala ndị chọrọ igbu onwe ha. Ma, ndị ọkachamara kwuru na ihe mere ụfọdụ ndị ji achọ igbu onwe ha abụghị na ha chọrọ ịnwụ kama ọ bụ na ike ahụhụ agwụla ha. N’obi ha, ha ekwesịghị ịnọ ndụ. Ma, e nwere ihe ndị mere ha ga-eji dị ndụ.

Ka anyị kwuo banyere ihe atọ mere anyị ga-eji nọrọ ndụ.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.