Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

Akụkọ Gbasara Afrịka

Akụkọ Gbasara Afrịka

Òtù dị iche iche na ụfọdụ ndị na-agbalịsi ike ka ihe isi ike kwụsị n’Afrịka. Ma, ihe na-ebenụ ka na-ebe.

Igbu Raịno

A na-akpọ anụmanụ ndị a e sere ebe a raịno. Na Saụt Afrịka, a machiri ndị mmadụ igbu raịno. Ma, ndị mmadụ ka na-egbu ya. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2007, e gburu naanị raịno iri na atọ. Ma n’afọ 2013, e gburu otu puku raịno na anọ. Ihe ha ji egbu ya bụ maka na ha na-ere mpi ya ere. N’agbanyeghị na mpi ya juru eju n’ebe a na-ere ya, ọ na-ada ọnụ karịa ọlaedo n’ihi na ọtụtụ ndị na-achọ ịzụ ya. Otu mpi ya na-adarucha ihe dị ka iri nde naịra asaa na asatọ, narị puku itoolu na iri puku ise.

IHE A GA-ECHEBARA ECHICHE: Ndị ọchịchị hà ga-emeli ka ụmụ mmadụ kwụsị imebi iwu?—Jeremaya 10:23.

Ịna Aka Azụ

E nwere òtù na-ahụ na ndị mmadụ na-akwụwa aka ọtọ n’ụwa niile. Òtù a kwuru na mba ndị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka kacha ana aka azụ n’ụwa niile. Ma, ọtụtụ ndị a naara aka azụ ma ọ bụ ndị hụrụ ebe a na-anara ya, na-agba nkịtị. Ọnụ na-ekwuchitere òtù a na Kenya kwuru, sị: “Obi anaghị aka ndị mmadụ na ndị ọchịchị ga-eme ihe ọ bụla ma a gwa ha gbasara ndị nara aka azụ.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ngarị na-ekpuchi ndị na-ahụ ụzọ nke ọma anya.”—Ọpụpụ 23:8.

Ndị afrịka na Ịntanet

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka Ịntanet n’ụwa niile kwuru na e kee ndị Afrịka ụzọ otu narị, a na-atụ anya na tupu afọ 2014 agwụ, ihe dị ka ụzọ iri abụọ n’ime ha ga na-aga n’Ịntanet. N’Afrịka, ndị ji ekwentị ma ọ bụ ihe ndị yiri ya aga n’Ịntanet ka ndị na-aga n’Ịntanet n’ụwa niile okpukpu abụọ.