Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Uru Afụ Ọnụ Nwamba Baara Ya

Uru Afụ Ọnụ Nwamba Baara Ya

NWAMBA na-akpakarị n’abalị. Afụ ọnụ ya na-enyere ya aka ịmata mgbe ihe dị ya nso. Ọ na-enyekwara ya aka ịnwụde anụ ọ ga-eri.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: E nwere akwara ndị dị n’egbugbere ọnụ nwamba, bụ́ ebe afụ ọnụ ya dị. Akwara ndị ahụ gara n’ụbụrụ ya. Ọ bụ ha na-eme ka ọ dịrị ya mfe iji afụ ọnụ ya mata obere ihe ọ bụla merenụ, dị ka mgbe obere ikuku na-eku. Ọ bụ otú a akwara ndị ahụ si arụ ọrụ na-enyere nwamba aka ịmata mgbe ihe nọ ya nso, ọ bụrụgodị na ọ hụghị ya anya. Ihe a na-akacha enyere ya aka n’abalị.

Ebe ọ bụ na afụ ọnụ nwamba na-enyere ya aka ịmata na o nwere ihe nọ ya nso, ya sọkwa ya ya bụrụ na ọ hụghị ihe ahụ, ọ na-eji ya ama ebe anụ ọ chọrọ ịnwụde nọ. Nwamba chọọ ịba n’ọnụ, afụ ọnụ ya na-enyere ya aka ịma ma ọ̀ ga-aba ya. Otu akwụkwọ kwuru na “anyị enweghị ike ịghọtacha ọrụ niile afụ ọnụ nwamba na-arụrụ ya. Ma, ihe ga-enyere anyị aka ịghọtatụ ya bụ ihe na-eme ma a chapụ ya. Nwamba anaghị emeli ihe ọ bụla ma a chapụ afụ ọnụ ya.”

Ndị ọkachamara na-agbasi mbọ ike ka ha rụpụta robọt ga-enwe ihe ndị ga-enyere ya aka ịmata mgbe o ruru ihe ọ bụla nso, otú ahụ afụ ọnụ nwamba si enyere ya aka ịmata mgbe ọ bụla ihe nọ ya nso. Otu ọkachamara na-akụzi sayensị na Mahadum Kalịfọnịa dị n’Amerịka kwuru na ihe ndị ahụ ga-eme ka a rụpụta robọt bụ́ ọkpọka nakwa ihe ndị ọzọ a ga-eji na-agwa kọmputa na ígwè ọrụ ndị ọzọ ihe ha ga-eme.

Gịnị ka i chere? Otú afụ ọnụ nwamba si arụ ọrụ ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?