Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE GA-ENYERE NDỊ NA-ERU UJU AKA

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Mmadụ—Ihe I Nwere Ike Ime

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Mmadụ—Ihe I Nwere Ike Ime

Ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị, gị achọwa ịmata ihe ga-enyere gị aka idi ya, ị ga-ahụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ kwurula nwere ike inyere onye mmadụ nwụnahụrụ aka. Ụfọdụ nwere ike ịbara gị uru, ndị ọzọ nwere ike ha agaghị abachara gị uru. Ihe nwere ike ịkpata ya bụ ihe anyị kwuburu, ya bụ, na otú onye ọ bụla si eru uju abụghị otu. Ihe nyeere otu onye aka nwere ike ọ gaghị enyere onye nke ọzọ aka.

N’agbanyeghị ya, e nwere ihe ndị bụ́ isi nyerela ọtụtụ ndị aka. Ndị ọkachamara na-enye ndị na-eru uju ndụmọdụ na-ekwukarị gbasara ya. Ihe ndị ahụ si n’otu akwụkwọ merela ochie nke amamihe juru na ya, aha ya bụ Baịbụl.

1: KWE KA NDỊ ENYI GỊ NA NDỊ IKWU GỊ NYERE GỊ AKA

  • Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na mmadụ ikwe ka ndị enyi na ndị ikwu ya nọrọ ya nso bụ ihe na-akacha enyere onye na-eru uju aka. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ ị ga-achọ ịnọrọ onwe gị. I nwedịrị ike wesawara ndị chọrọ inyere gị aka iwe. Ọ bụghị naanị gị ka ọ na-adị otú ahụ.

  • Echekwala na ọ bụ iwu na gị na ndị mmadụ ga na-anọ mgbe niile, ma i kwesịghịkwa ịgbara ha ọsọ. A sị kwuwe, i nwere ike ịchọ ka ha nyere gị aka n’ọdịnihu. N’ihi ya, medaa obi gwa ndị bịaara gị mgbaru mgbe ị chọrọ ịnọrọ onwe gị na mgbe ị chọrọ ka gị na ha nọrọ.

  • Dabere n’otú ahụ́ dị gị, mara mgbe gị na ndị mmadụ kwesịrị ịnọ na mgbe ị ga-achọ ịnọrọ onwe gị.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Abụọ dị mma karịa otu . . . N’ihi na ọ bụrụ na otu onye n’ime ha adaa, onye nke ọzọ ga-enyere ya aka ka o bilie.”—Ekliziastis 4:9, 10.

2: NA-ERI EZIGBO NRI, NA-EMEGAKWA AHỤ́

  • Iri ezigbo nri na-eme ka ahụ́ na-adịtụ onye na-eru uju mma. Na-eri mkpụrụ osisi dị iche iche, akwụkwọ nri na anụ ndị na-enweghị abụba buru ibu.

  • Na-aṅụ mmiri na ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ́.

  • Ọ bụrụ na nri anaghị ekwecha gị oriri, na-eritụ obere ugboro ugboro. I nwekwara ike ịga hụ dọkịta ka ọ gwa gị ọgwụ ndị na-edozi ahụ́ i nwere ike ịṅụ. a

  • Ịgasi ije ike na ụdị mmega ahụ́ ndị ọzọ nwere ike ime ka mmadụ ghara ịna-echegbu onwe ya. Mmega ahụ́ na-eme ka ụfọdụ ndị nwee ohere iche banyere ihe mere ha. O nwekwara ndị ọ na-enyere aka ichefutụ ihe mere ha.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla kpọtụrụla ahụ́ ya asị, kama ọ na-azụ ahụ́ ya, na-elekọtakwa ya.”—Ndị Efesọs 5:29.

3: NA-EHI ỤRA NKE ỌMA

  • Ihi ụra bara ezigbo uru. Ndị mmadụ nwụnahụrụ kwesịrị ịna-ehi ụra nke ọma, karịchaa n’ihi na iru uju nwere ike ime ka ike na-agwụ ha.

  • Kpachara anya n’otú i si eri ma ọ bụ aṅụ ihe ọ bụla na-egbochi mmadụ ihi ụra nakwa otú i si aṅụ mmanya na-aba n’anya.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.”—Ekliziastis 4:6.

4: CHỌPỤTA OTÚ Ị GA-ESI EDI YA

  • Cheta na otú onye ọ bụla si eru uju abụghị otu. N’ihi ya, i kwesịrị ịchọpụta otú ga-akara gị mma ị ga-esi edi ihe mere gị.

  • Ọtụtụ ndị achọpụtala na ime ka ndị ọzọ mata otú obi dị ha na-enyere ha aka idi ya. Ma, e nwere ndị nke ọ na-akara mma ịghara ime ka ndị ọzọ mara. Ndị ọkachamara enweghị otu olu n’otú kacha mma e si edi ọnwụ mmadụ. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgwa mmadụ otú obi dị gị, i nwere ike ịgakwuru ezigbo enyi gị, kọtụrụ ya otú obi dị gị.

  • Ibe ezigbo ákwá na-enyere ụfọdụ ndị aka idi ihe mere ha, ma e nwekwara ndị nke na-edi ya ọ bụrụgodị na ha ebeghị ezigbo ákwá.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ọ bụla ma ihe bụ́ nsogbu ya na ahụhụ ọ na-ata.”—2 Ihe E Mere 6:29.

5: EMEKWALA IHE NDỊ GA-AKPATARA GỊ NSOGBU

  • Ụfọdụ ndị na-eru uju na-amalite ịṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ike ka ha nwee ike ichefutụ ụwa ha. Ma, ime otú ahụ bụ mmadụ iji aka ya egbu onwe ya. O nwere ike iyi ha ka hà nwetatụrụ onwe ha, ma ọ naghị adịgide, kama, ọ na-akpatara ha ọtụtụ nsogbu. Chọọ otú ị ga-esi edi ihe mere gị ma ghara ịkpatara onwe gị nsogbu.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka anyị sachapụ ihe niile na-emerụ . . . anyị.”—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

6: GBANWEE IHE I JI OGE GỊ NA-EME

  • Ọtụtụ achọpụtala na ihe ga-enyere ha aka ịghara ịna-eche banyere ihe mere ha mgbe niile bụ iji oge ha ụfọdụ na-eme ihe ga-eme ka ha wepụtụ obi na ya.

  • I nwere ike imeta ndị enyi ọhụrụ ma ọ bụkwanụ chọọ ihe ị ga-eme ka gị na ndị enyi gị dịkwuo ná mma. I nwekwara ike ịmụ otú e si eme ihe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ gị esoro ndị ọzọ gwuo egwuregwu.

  • Ka oge na-aga, ihe nwere ike ịgbanwe. I nwere ike ịchọpụta na i jirila nwayọọ nwayọọ kwụsịwa iru uju.

IHE BAỊBỤL KWURU: “E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla, . . . oge ibe ákwá na oge ịchị ọchị; oge ibe ákwá arịrị na oge ịgba egwú.”—Ekliziastis 3:1, 4.

7: NWEE OGE A KAPỊRỊ ỌNỤ I JI EME IHE

  • Ozugbo o kwere gị mee, malite ime ihe ndị ị na-emebu.

  • O nwere ike ịdịrị gị mfe inweta onwe gị ma ọ bụrụ na i nwee oge a kapịrị ọnụ i ji ehi ụra, arụ ọrụ ma ọ bụ eme ihe ndị ọzọ dịịrị gị.

  • Ọ bụrụ na i jiri oge gị na-eme ihe ndị bara uru, ọ ga-eme ka obi ghara ịna-ajọkarị gị njọ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “N’ihi na ọ gaghị dị ama na ụbọchị ndụ ya na-agwụ n’ike n’ike, maka na ezi Chineke na-eme ka aṅụrị ju ya obi.”—Ekliziastis 5:20.

8: EMEKWALA MKPEBI NDỊ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ ỌKỤ ỌKỤ

  • Ọtụtụ ndị mere mkpebi gbara ọkpụrụkpụ ozugbo onye ha nwụchara na-emecha kwaara ya mmakwara.

  • Ọ bụrụ na o kwe mee, chere ka oge gatụ tupu gị ekpebiwe ịkwapụ n’ebe i bi, ịgbanwe ọrụ ị na-arụbu, ma ọ bụ ịtụfu ihe ụfọdụ onye ahụ nwụrụ anwụ nwere.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya, ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.”—Ilu 21:5.

9: NA-ECHETA ONYE AHỤ NWỤNAHỤRỤ GỊ

  • Ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-ekwu na ime ihe ndị na-eme ka ha na-echeta onye ahụ nwụrụ anwụ na-enyere ha aka idi ọnwụ ya.

  • Idowe foto onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ị ga-eji na-echeta ya ebe ị ga na-ahụ ya nwere ike ịkasi gị obi. I nwekwara ike inwe akwụkwọ ebe ị ga na-ede ihe ụfọdụ banyere onye ahụ ma ọ bụ banyere ihe ndị unu mekọrọ ọnụ tọrọ gị ụtọ, ndị ị ga-achọ ịna-echeta.

  • Dowe ihe ndị ga-enyere gị aka icheta oge ndị gị na onye ahụ nwere obi ụtọ. E mechaa, gị elee ha.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Cheta nụ oge ochie.”—Diuterọnọmi 32:7.

10: ANỌLA OTU EBE

  • I nwere ike ime njem gaa nọtụ na nke mmadụ ma ọ bụ gaa n’ebe a na-elegharị anya.

  • Ọ bụrụ na ị gaghị emeli njem ruo ogologo oge, i nwere ike iwere otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ gaa legharịa anya n’ebe a na-egosi ihe mgbe ochie, ma ọ bụkwanụ gị ejiri ụkwụ ma ọ bụ ụgbọala gaa ebe dịtụ anya legharịa anya.

  • Ime naanị obere mgbanwe n’ihe ndị ị na-emebu nwere ike inyere gị aka idi ihe mere gị.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.”—Mak 6:31.

11: NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA

  • Cheta na oge ọ bụla i ji nyere ndị ọzọ aka ga-eme ka i nwetatụ onwe gị.

  • I nwere ike bido inyere ndị ọzọ ọnwụ onye ahụ metụtara aka, dị ka ndị enyi na ndị ikwu gị. I nwere ike ịga nọnyere ha ma ọ bụ kasie ha obi, n’ihi na ha nwekwara ike ịna-achọ onye ga-eso ha akwa ụwa.

  • Inyere ndị ọzọ aka na ịkasi ha obi nwere ike ime ka i nwewakwa obi ụtọ, meekwa ka ike ndụ ghara ịgwụ gị.

IHE BAỊBỤL KWURU: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ Ndịozi 20:35.

12: LEBAGHARỊA ANYA N’IHE NDỊ I WEERE KA IHE NDỊ KA MKPA

  • Mmadụ nwere ike ịghọtakwu ihe ka mkpa ná ndụ n’oge ọ na-eru uju.

  • Jiri oge ahụ ị na-eru uju chebara ihe i ji ndụ gị na-eme echiche.

  • Mee mgbanwe n’ihe ndị i weere ka ihe ka mkpa ná ndụ gị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ dị mma ịga n’ebe a na-eru uju karịa ịga n’ebe a na-eri oriri, n’ihi na mmadụ niile na-anwụ anwụ, ndị dị ndụ kwesịkwara iburu ya n’obi.”—Ekliziastis 7:2.

N’eziokwu, e nweghị ihe ga-eme ka mwute ị na-enwe pụchaa gị n’obi kpamkpam. Ma, ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụla ga-ekweta na ime ihe ndị ga-enyere ha aka idi ọnwụ onye ha, dị ka ndị a e kwuru n’isiokwu a, kasiri ha obi. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ihe niile ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ mmadụ ka e dere ebe a, ma ọ bụrụ na ị gbalịa mee ụfọdụ n’ime ha, ọ ga-enyere gị aka.

a Teta! anaghị agwa mmadụ otú ọ ga-ahọrọ ka e si gwọọ ya.