Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

3 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Idi Nsogbu

3 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Idi Nsogbu

E nwere nsogbu ụfọdụ anyị na-agaghị ezereli ugbu a ma ọ bụ kwụsị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị ma ọ bụkwanụ na o nwere ọrịa na-anaghị ala ala gị na ya na-alụ, o nwere ike ịbụ na e nweghị ihe ọzọ ị ga-emeli ma ọ bụghị idi ya. Ma, Baịbụl ò nwere ike inyere mmadụ aka n’ụdị ọnọdụ a?

ỌRỊA NA-ANAGHỊ ALA ALA

E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rose. O kwuru, sị: “E nwere otu ọrịa m na-arịa si n’agbụrụ anyị. Ọrịa a na-eme ka ahụ́ na-egbu m ezigbo mgbu mgbe ọ bụla. Ihe a emeela ka ndụ na-agwụ m ike.” Otu n’ime ihe kacha ewute ya bụ na ọ na-eme ka ọ na-esiri ya ike ịmụ Baịbụl na ime ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke. Ma, ihe Jizọs kwuru na Matiu 19:26 nyeere ya ezigbo aka. Ebe ahụ sịrị: “N’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.” Rose chọpụtara na e nwere ụzọ ndị ọzọ o nwere ike isi na-amụ ihe. Ebe ọ bụ na ahụ́ na-egbu ya mgbu mere ka ịgụ ihe na-esiri ya ike mgbe ụfọdụ, ọ malitere na-egere Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl e tinyere na teepụ. * Ọ sịrị: “Amaghị m otú m gaara esi na-amụ ihe ndị ga-eme ka mụ na Jehova na-adị ná mma, ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ndị a.”

Obi jọwa Rose njọ n’ihi ihe ndị ọ na-anaghị emelizi, ihe e dere ná 2 Ndị Kọrịnt 8:12 na-akasi ya obi. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na unu bu ụzọ dịrị njikere, ọ bụ ihe a na-anabata karịsịa dị ka ihe mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe mmadụ na-enweghị si dị.” Ihe amaokwu Baịbụl a kwuru na-echetara Rose na ihe ọ na-eme na-atọ Chineke ụtọ n’ihi na ọ na-eme ike ya niile.

MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

Delphine e kwuru gbasara ya ná mbụ kwuru, sị: “Mgbe nwa m nwaanyị dị afọ iri na asatọ nwụrụ, o wutere m nke ukwuu nke na echere m na agaghị m edili ya. Ihe niile gbanwere.” Ihe e kwuru n’Abụ Ọma 94:19 kasiri ya obi. N’ebe ahụ, otu onye so dee Abụ Ọma gwara Chineke, sị: “Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.” Delphine kwuru, sị: “M rịọrọ Jehova ka o nyere m aka ịmata ihe ndị m ga na-eme ga-enye aka mee ka ahụ́ ruo m ala.”

Delphine wepụtara onwe ya na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. O mechara jiri onwe ya tụnyere kreyọn ụmụaka ji ese ihe. Ọ bụrụgodị na e nwee ndị nke gbajiri agbaji, ha ka na-eji ya eteji ihe ha sere. N’agbanyeghị na o chere na ndụ ọ dị enweghịzi isi, ọ chọpụtara na ya ka nwere ike ịna-enyere ndị ọzọ aka. O kwuru, sị: “M chọpụtara na iji ihe Baịbụl kwuru na-enyere ndị m na-amụrụ Baịbụl aka bụ otú Jehova si enyere m aka idi nsogbu m ma na-akasi m obi.” Ọ bịara depụta ụfọdụ ndị a kọrọ gbasara ha na Baịbụl mmadụ nwụnahụrụ. Ọ chọpụtara “na ha niile ejighị ekpere egwu egwu.” Ọ chọpụtakwara na “ịgụ Baịbụl ga-enyeliri mmadụ aka idi nsogbu.”

Ịmụ Baịbụl enyekwarala Delphine aka ịna-eche gbasara ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụghị ihe ndị merela eme. Ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 24:15 na-akasi ya obi. Ebe ahụ sịrị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” Obi ò siri Delphine ike na Jehova ga-akpọlite nwa ya nwaanyị n’ọnwụ? Delphine zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “M na-ahụ nwa m nwaanyị mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Ahazichaala m ihe m ga-eme ụbọchị mụ na ya ga-anọrị. M na-ahụ nnọọ ka mụ na ya nọ otú ahụ m si hụ ya ụbọchị ahụ m mụrụ ya.”

^ para. 4 E nwere ọtụtụ n’ime ihe a na-egere egere e tinyere na teepụ n’adres Ịntanet bụ́ jw.org.

Baịbụl ga-akasili gị obi ma mgbe nsogbu karịrị gị bịaara gị