Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

TETA! Nke 2 n'Afọ 2021 | Ekwentị Ọ̀ Bụ Ọga Gị Ka Ọ̀ Bụ Odibo Gị?

Ekwentị na ihe ndị yiri ya hà bụ ọga gị ka hà bụ odibo gị? Ọtụtụ ndị nwere ike ikwu na ihe ndị a abụghị ọga ha. Ma, ihe ndị a nwere ike iji nwayọọ nwayọọ na-akpatara ha nsogbu. O nwedịrị ike ha agaghị ama na ọ na-akpatara ha nsogbu.

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gị na Ndị Enyi Gị?

Ekwentị nwere ike inyere gị na ndị enyi gị aka ịna-akparịta ụka, gị na ha adịkwuokwa ná mma.

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Ụmụ Gị?

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ụmụaka ma otú e si apị ekwentị nke ọma, ma ọ ka dị mkpa ka a na-eduzi ha.

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị?

Di na nwunye jiri ekwentị na-eme ihe nke ọma, o nwere ike ime ka ha abụọ dịkwuo ná mma.

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa n’Onwe Gị?

O nwere ike ime ka ị ghara ịna-agụ ihe nke ọma, ka ị ghara ịna-etinye uche gị n’ihe ị na-eme, nakwa ka obi na-ajọ gị njọ ma ị nọrọ naanị gị. Lee ihe atọ ga-enyere gị aka.

Mụtakwuo Ihe Ndị Ọzọ na JW.ORG

Olee isiokwu nke ị ga-achọ ịgụ?

Isiokwu Ndị Dị na Teta! A

Gụọ akwụkwọ a ka ị mata nsogbu ụfọdụ ọ ga-abụ na ekwentị na-akpatara gị na ndị enyi gị, ezinụlọ gị, na gịnwa n’onwe gị.