Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị?

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị?

Di na nwunye jiri ekwentị na-eme ihe nke ọma, o nwere ike ime ka ha abụọ dịkwuo ná mma. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike iji ekwentị na-akpọtụrụ ibe ha n’oge ọ bụla n’ụbọchị.

Ma, ụfọdụ ndị di na nwunye na-ekwe ka ekwentị . . .

  • na-ewekọrọ oge ha na ibe ha ji anọrị.

  • mee ka ha na-arụkwa ọrụ n’ụlọ mgbe ha gbasarala ọrụ.

  • mee ka ha ghara ịtụkwasị ibe ha obi ma ọ bụdị gbawa n’èzí.

IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA

OGE UNU ABỤỌ JI ANỌRỊ

Otu nwoke aha ya bụ Michael kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ mụ na nwunye m nọrọ, ya adị m ka ọ nọghị ya. Uche ya niile dị n’ekwentị ọ na-apị. M jụọ ya, ya asị m na o lebeghị ozi ndị e ziteere ya kemgbe.” Otu nwoke aha ya bụ Jonathan kwuru na ọ bụrụ na ụdị ihe a ana-eme, “di na nwunye nwere ike ịnọ otu ebe ma ya eyie ka hà nọ ibe ha ebe dị ezigbo anya.”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ugboro ole ka gị na mmadụ ikwu n’ekwentị ma ọ bụ izigara mmadụ ozi n’ekwentị na-eme ka ị ghara iso di gị ma ọ bụ nwunye gị nọrịa nke ọma?​—NDỊ EFESỌS 5:33.

ỌRỤ

O nwere ndị ọrụ ha mere ka ọ dị mkpa na ha ga-aza ekwentị ha ma ọ bụ gụọ ozi iimel ha ma mgbe ha nọ n’ụlọ, ọ sọgodị ya ya bụrụ n’abalị. Ma, ụfọdụ ndị ọrụ ha na-adịghị otú a ka na-anọkwa na-arụ ọrụ ma mgbe ha gbasara ọrụ laa n’ụlọ. Otu nwoke aha ya bụ Lee kwuru, sị: “Ọ na-esiri m ike ịhapụ ịza ekwentị m ma ọ bụ ịgụ ozi gbasara ọrụ n’oge m wepụtara mụ na nwunye m ga-eji na-anọrị.” Otu nwaanyị aha ya bụ Joy kwuru, sị: “M na-esi n’ụlọ arụ ọrụ, n’ihi ya, mụ na ọrụ m na-anọ mgbe niile. Ọ naghị adị mfe ịma mgbe m kwesịrị ịhapụtụ ọrụ mee ihe ndị ọzọ.”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ị̀ na-ege di gị ma ọ bụ nwunye gị ntị nke ọma ma ọ gwawa gị okwu?​—LUK 8:18.

ỊGBA N’ÈZÍ

N’otu nchọpụta e mere, ọtụtụ di na nwunye kwuru na e nweela mgbe ha sere okwu n’ihi na onye nke ọzọ na-enyo ihe ibe ya na-etinye n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet enyo. Ụfọdụ n’ime ndị e ji mee nchọpụta a kwetadịrị na e nweela mgbe ha tinyere ihe ha na-agaghị achọ ka di ha ma ọ bụ nwunye ha mara banyere ya n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet.

Ọ bụ ihe a mere ọtụtụ ndị ji ekwu na ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet nwere ike ịkpatara di na nwunye nsogbu. O nwedịrị ike ime ka ọ dị mfe mmadụ ịgba n’èzí. Ka a sịkwa ihe mere ndị ọkàiwu na-eleba anya n’okwu gbasara ịgba alụkwaghịm ji kwuo na ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet so n’ihe kacha akpata ịgba alụkwaghịm ndị a na-enwe taa.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ị̀ na-ezochiri di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kparịtara n’Ịntanet?​—ILU 4:23.

IHE I NWERE IKE IME

BURU ỤZỌ MEE IHE NDỊ KA MKPA

Ọ bụrụ na mmadụ akwụsị iri nri, ahụ́ ga-ebido nyewe ya nsogbu. Ọ bụrụkwa na mmadụ akwụsị iso di ya ma ọ bụ nwunye ya na-anọrị, ha ga-ebido inwe nsogbu. ​—Ndị Efesọs 5:​28, 29.

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—NDỊ FILIPAỊ 1:10.

Kwurịtanụ ihe ndị e dere n’okpuru ebe a unu ga-achọ ime, ma ọ bụkwanụ gị edee ihe ndị i chere ga-enyere unu aka ka ekwentị ghara ịkpatara unu nsogbu n’ezinụlọ unu.

  • Anyị ga na-erikọ nri ọnụ ọ bụrụgodị otu ugboro n’ụbọchị ọ bụla

  • Anyị ga-enwe oge onye ọ bụla ga-ahapụ ekwentị ya

  • Anyị ga-ewepụta ụbọchị anyị ga-eji gaa tụrụtụ ndụ ma ọ bụkwanụ oge ọzọ pụrụ iche anyị ga-eji nọrịa

  • Anyị ga na-agbanyụ ekwentị anyị agbanyụ n’abalị, dowekwa ha ebe aka anyị na-agaghị eru ha ngwa ngwa

  • N’ụbọchị ọ bụla, anyị ga na-ahapụtụ ekwentị anyị, jiri nkeji iri na ise kwurịta okwu

  • Anyị ga-enwe oge anyị kpebiri anyị ga-eji na-agbanyụ Ịntanet anyị