Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị E Dere na Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru Taa?

Ihe Ndị E Dere na Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru Taa?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU NA Ọ BAGHỊZI URU. Otu dọkịta kwuru na mmadụ iji ihe Baịbụl kwuru ekpebi ihe ọ ga-eme dị ka iji akwụkwọ kemistrị e dere kemgbe afọ 1920 akụzi ihe ugbu a. Onye na-ekwetaghị na Baịbụl nwedịrị ike ịjụ ma mmadụ ò nwere ike iji akwụkwọ kọwara otú kọmputa mgbe ochie si arụ ọrụ mata otú nke ọgbara ọhụrụ si arụ ọrụ. Ihe ọ pụtara bụ na ụfọdụ ndị na-ewere Baịbụl ka akwụkwọ na-enweghịzi uru ọ bara.

Olee otú mmadụ ga-esi na-achọ ihe ga-enyere ya aka n’akwụkwọ mgbe ochie, n’ụwa a e nwerela ọtụtụ ihe ọgbara ọhụrụ nwere ike inyere ya aka? A sị ka e kwuwe, ị gaa n’ọtụtụ ebe n’Ịntanet, ị ga-ahụ ihe ndị kacha ọhụrụ e kwuru gbasara isiokwu dị iche iche nwere ike ịbara mmadụ uru. N’ọtụtụ ihe omume tiivi, a na-ekwukwa ọtụtụ ihe ndị na-ede akwụkwọ na ndị ọkachamara kwuru nwere ike inyere mmadụ aka. N’ọtụtụ ebe a na-ere akwụkwọ, e nwekwara ọtụtụ akwụkwọ nwere ike inyere mmadụ aka. Ndị na-ere ha na-enweta ezigbo ego n’ihi na imeriime mmadụ na-abịa azụ ha.

Ebe ọ bụ na e nwere ebe mmadụ nwere ike isi mata ihe ọhụrụ a chọpụtara gbasara ihe dị iche iche, gịnịzi mere ọ ga-eji gụwa akwụkwọ e dechara kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga? Ihe ahụ ndị na-ekwetaghị na Baịbụl kwuru, nke bụ́ na Baịbụl dị ka akwụkwọ kemistrị mgbe ochie ma ọ bụ akwụkwọ kọmputa mgbe ochie, ọ̀ bụ eziokwu? Mba, ọ bụghị eziokwu. Sayensị na nkà na ụzụ na-agbanwe n’ike n’ike, ma ihe dị ndị mmadụ mkpa ọ̀ gbanweela? Ndị mmadụ ka chọrọ ka ndụ ha na-ebi nwee isi. Ha chọkwara ka ha na-enwe obi ụtọ, ka obi ruo ha ala, ka udo dị n’ezinụlọ ha, nakwa ka ha nwee ezigbo ndị enyi.

N’agbanyeghị na Baịbụl emeela ochie, o kwuru ihe ndị ga-enyere mmadụ aka n’ihe ndị a, nakwa n’ihe ndị ọzọ. Baịbụl sịkwara na ọ bụ Chineke gwara ndị dere ya ihe ha dere. O kwuru na ihe ndị e dere na ya ga-eduzi anyị n’ihe ọ bụla anyị na-eme, nyekwara anyị aka ná nsogbu ọ bụla anyị nwere. (2 Timoti 3:16, 17) Baịbụl kwukwara na ihe ndị o kwuru na-aba uru mgbe niile. Oge ha anaghị agafe agafe. O kwudịrị, sị: “Okwu Chineke dị ndụ.”—Ndị Hibru 4:12.

Ọ̀ bụ eziokwu na Baịbụl ga-emeli ihe ndị a? Oge ya ọ̀ gafeela ka ọ̀ bụ akwụkwọ kacha baa uru taa n’eziokwu? Ụlọ Nche a ga-enyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a. Malite n’Ụlọ Nche nke a gawa, isiokwu niile dị na nke ọ bụla ga-apụ iche n’ihi na ha niile ga na-ekwu gbasara otu ihe.