Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

4 | Chineke Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Ịkpọ Ndị Mmadụ Asị

4 | Chineke Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Ịkpọ Ndị Mmadụ Asị

Ihe Baịbụl Kwuru:

“Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ndidi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, mmadụ ijide onwe ya.”​NDỊ GALESHIA 5:22, 23.

Ihe Ọ Pụtara:

Chineke ga-enyeliri mmadụ aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. Mmụọ nsọ ya ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà ndị anyị na-agaghị enwe ike ịkpa n’onwe anyị. N’ihi ya, kama ịgbalịwa ka anyị kwụsị ịkpọ ndị mmadụ asị n’onwe anyị, anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi ka o nyere anyị aka ịkwụsị ya. Anyị mee ya, anyị ga-adị ka Pọl onyeozi, onye sịrị: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) N’eziokwu, anyị ga-enwe ike ịsị: “Ọ bụ Jehova . . . ga-enyere m aka.”​—Abụ Ọma 121:2.

Ihe I Nwere Ike Ime:

“Jehova enyerela m aka, mụ akwụsị ime ihe ike ma ghọọ onye na-eme udo.”​—WALDO

Jiri obi gị niile rịọ Jehova n’ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Rịọ ya ka o nyere gị aka ịna-akpa àgwà ndị na-amasị ya. Mụọ ihe Baịbụl kwuru gbasara àgwà ndị na-eme ka mmadụ kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị, àgwà ndị dị ka, ịhụnanya, udo, ndidi, na mmadụ ijide onwe ya. Gbalịakwa ka ị na-akpa àgwà ndị ahụ. Gị na ndị na-agbalị ịkpa àgwà ndị a na-akpakwa. Ha nwere ike inyere gị aka ‘ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ.’​—Ndị Hibru 10:24.