Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Ọtụtụ Ndị Kpọburu M Asị”

“Ọtụtụ Ndị Kpọburu M Asị”
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1978

  • ABỤ M ONYE: CHILI

  • NDỤ M BIRI: IME IHE IKE RIRI M AHỤ́

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

M toro na Santiego, bụ́ isi obodo mba Chili. N’ebe ahụ, e nwere ọtụtụ ndị na-aṅụ ọgwụ ike na ndị nọ n’òtù ọjọọ nakwa ndị na-eme mpụ. E gburu papa m mgbe m dị afọ ise. Mgbe e gbuchara ya, mama m na otu nwoke obi ọjọọ biweziri. Ọtụtụ mgbe, ọ na-akụ mụ na mama m ihe. Ihe o mere anyị n’oge ahụ ka na-enye m nsogbu n’obi.

Mgbe m na-eto, ihe ọjọọ m na-ahụ mere ka m malite ime ihe ike. M na-ege egwú na-ada oké ụda, na-aṅụ oké mmanya, na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ mgbe ụfọdụ. Mụ na ndị na-ere ọgwụ ọjọọ na-alụkarị ọgụ n’okporo ámá. E nwekwara ọtụtụ ugboro ha chọrọ igbu m. O nwere mgbe ndị òtù ọjọọ, bụ́ ndị anyị na ha na-adịghị ná mma, kwụrụ otu onye akpụ obi a ma ama ụgwọ ka o gbuo m. Mgbe ọ bịara igbu m, ọ mara m mma, mụ erie mbọ mbọ. O nwekwara mgbe ndị na-ere ọgwụ ọjọọ tụgidere m égbè n’isi, chọwa ịkwụgbu m.

N’afọ 1996, m hụrụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ Carolina. Ihe ya masịrị m. N’ihi ya, m lụrụ ya n’afọ 1998. Mgbe anyị mụchara nwa anyị nwoke nke mbụ, ụjọ tụwara m na iwe ọkụ m na-ewe nwere ike ime ka m kpawa àgwà ka nwoke ahụ ya na mama m bi ma na-emesi ndị ezinụlọ m ike. Nke a mere ka m gaa ụlọ ọgwụ ka ndị dọkịta nyere m aka. Ha nyere m ọgwụ ma gwa m ihe ndị m ga na-eme. Ma, ihe na-ebenụ ka na-ebe. Obere ihe ka na-akpasu m iwe. Anaghị m ejiteli onwe m. Anwara m igbu onwe m otu ụbọchị ebe m na-achọ ihe m ga-eme ka m kwụsị imesi ndị ezinụlọ m ike. Ma ihe ọma meere m bụ na mbọ m gbara n’ụbọchị ahụ ka m gbuo onwe m enweghị isi.

Kemgbe ọtụtụ afọ, ekweghị m na Chineke. Ma, m chọkwaranụ ikwere na Chineke. Nke a mere ka m bido ịga chọọchị. Ka nke a na-eme, Ndịàmà Jehova amalitela ịkụziri nwunye m Baịbụl. Ma, anaghị m achọ iji anya ahụ Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ mgbe, m na-akpọ ha iyi. Ma, ebe ọ bụ na ha abụghị ndị okwu na ụka, ha na-eji olu ọma agwa m okwu, bụ́kwanụ ihe m na-atụghị anya na ha ga-eme.

Otu ụbọchị, nwunye m gwara m gụọ Abụ Ọma 83:18 na Baịbụl m. Amaokwu ahụ kwuru na aha Chineke bụ Jehova. O juru m anya ịhụ aha ahụ ebe ọ bụ na ihe a kụziiri m na chọọchị bụ na e nwere Chineke, ma a kụzirighị m banyere Jehova.  Ná mmalite afọ 2000, mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Ka m na-amụkwu Baịbụl, ahụ́ bịara ruo m ala mgbe m mụtara na Jehova bụ Chineke obiọma nke na-agbaghara mmehie. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru n’Ọpụpụ 34:6, 7, na Jehova bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-eme ka obiọma ya ruoro ọtụtụ puku ọgbọ, na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie.”

Ma, ọ dịrịghị m mfe ime ihe m na-amụta. M chekwara na mụ emekataghị kwụsị iwe iwe ọkụ. Ma, mgbe ọ bụla m were iwe ọkụ, nwunye m na-agwa m na m ga-akwụsịli ya, na obi ekwesịghị ịda m mbà. Ọ na-echetara m na Jehova na-ahụ mbọ niile m na-agba ka m kwụsị ya. Ọ bụ ume ọ na-agba m mere m ji na-agbalịsi ike ka m mee ihe dị Jehova mma n’agbanyeghị na m na-echekarị na enweghị m mmekwata.

Otu ụbọchị, Alejandro bụ́ onye na-akụziri m Baịbụl gwara m ka m gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23. Ebe ahụ kwuru na “mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” Alejandro gwara m na ihe ga-eme ka m mụta àgwà ndị ahụ bụ mmụọ nsọ Chineke, ọ bụghị ike nke onwe m. Ihe a ọ gwara m mere ka m gbanwee otú m si ele ihe anya.

M mechara gaa otu nnukwu mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere. Otú e si hazie ihe niile nke ọma ná mgbakọ ahụ na otú ebe niile si dị ọcha nakwa otú onye ukwu na onye nta si nọrọ n’udo mere ka m mara na mụ ahụla ndị na-efe Chineke. (Jọn 13:34, 35) E mere m baptizim na Febụwarị 2001.

URU NDỊ M RITERELA:

Jehova enyerela m aka, mụ akwụsị ime ihe ike ma ghọọ onye na-eme udo. Ọ dị m ka à ga-asị na e si n’olulu apịtị dọpụta m. Ọtụtụ ndị kpọburu m asị, ụta adịkwaranụghị ha. Ma ugbu a, obi eruola m ala n’ihi na mụ na nwunye m na ụmụ anyị nwoke abụọ na-efe Jehova.

O juru ndị mụ na ha na-akpabu na ndị ikwu m anya na ndụ m agbanweela. Nke a emeela ka ọtụtụ n’ime ha mụwa Baịbụl. M nyekwarala ndị ọzọ aka ka ha mara Jehova. Obi dị m ụtọ ịhụ otú ihe ha mụtara na Baịbụl si mee ka ndụ ha gbanweekwa.